Ndi Ripoblikan na-esi anya mmiri anya mmiri

Ndi Ripoblikan na-esi anya mmiri anya mmiri

Nov 8, 2012 - 05:59
Jan 20, 2021 - 05:59
 0
Ndi Ripoblikan na-esi anya mmiri anya mmiri

Ndị Rịpọblịkan na-anya isi si na ha agaghị ekwe ka onye isi ala Amerịka, bụ Barack Obama, nwete afọ anọ ọzọ n’ọkwa ya.

Obodo ederego duu n’ala Amerịka. Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Rịpọblịkan na-esi anya mmiri anya mmiri maka ihe ihere ha nwetere n’abalị ụnyaa.

Kemgbe afọ atọ na ọkara ka ndị Rịpọblịkan na-anya isi si na ha agaghị ekwe ka onye isi ala Amerịka, bụ Barack Obama, nwete afọ anọ ọzọ n’ọkwa ya. Kemgbe ahụ ka ha na-agba Obama mgba n’ụdị dị iche iche.

Mgbe ha mere ntụli aka nke okwuru ụlọ, ha họpụtara Mitt Romney, aka chiburu Steeti Massachussets, onye ha chere na ọ ga-emeri Obama na ntụli aka ozuru ọha.

Mgbe okwe gbara na ntụlị aka ozuru ọha ahụ e mere ụnya, Obama mere Romney ihu aja aja. Ndị Amerịka họpụtara Obama ọzọ, nye ya ikike ka ọ chịaa afọ anọ.

N’ogbe ebe ndị Rịpọblịkan zutere na Boston maka ịmata otu okwe siri gba, anya mmiri na-esi ebe niile. Chịa ọchị adịghị mma, ma bewe ebewe adịghị mma.

N’aka nke ọzọ, ụzụ, mkpọtụ na añụrị na-arị elu ebe ndị otu Obama zukọrọ na Chicago.

Mgbe o mechara were igwe okwu, Romney nabatara mmeri a Obama meriri ya. O kwuru na ya a kpọọlarị Obama n’ekwe ntị ya, si ya n’udo dị. Romney kpọkuru ndị Amerịka ka ha na-ekpere Obama ekpere ka Chineke nyere ya aka n’ịchị mba Amerịka, tụmadị n’oge ụnwụ a ha nọ n’ime ya.

Mgbe Obama n’onwe ya kwuru okwu, o kelere Romney na ndị otu ya. Ọ sịrị na ya ga-agba mbọ ịdozi nakwa ịme ka mba Amerịka dị mma ma lọghachi n’ọnọdụ ya dịka oke mba.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.