Ndị Ụmụeri Bi USA Edebàyela Mmadụ 100 N'Amụmà Nchekwa Ahụike Anambra

Jan 22, 2020 - 20:46
Jan 24, 2021 - 02:02
 0
Ndị Ụmụeri Bi USA Edebàyela Mmadụ 100 N'Amụmà Nchekwa Ahụike Anambra

Izunna Okafor, Awka

Onyeisi ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka amụmà nchekwa ahụike steeti Anambra, bụ 'Anambra State Health Insurance Agency (ASHIA),' bụ Dọkịta Simeon Onyemaechi akpọkuola ma dụọ ndị aka ji akụ n'obodo dị iche iche ka ha nye aka kwàdo ndebànye aha ụfọdụ ndị mmadụ n'usoro amụmà nchekwa ahụike ahụ.

Dọkịta Onyemaechi kwupụtàra nke a n'Ụmụeri, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East,' oge o dùrù ndị òtù ọrụ ya wee gaa idebànye aha ndị obodo ahụ karịrị otu nàrị n'ùsòrò amụma nchekwa ahụ ike ASHIA, bụ ndebànye nke a kwàdòrò site n'aka òtù jikọtara ndị Ụmụafọ Ụmụeri bi na mba USA.

Oge ọ na-akọwa ọtụtụ uru dị iche iche dị na mmadụ idebànyè aha n'usoro amụmà nchekwa ahụ ike ahụ, ọ mere ka a mara na ọ bụ ọchịchọ óbì Gọvanọ Willie Obianọ ịhụ na mmadụ ọbụla na ezinaụlọ ọbụla dị na steeti ahụ ga-esonye n'amụmà ahụ, bụzị nke mere ọchịchị ya ji emefù ụkwụtụụkwụ ego n'ịkwàdo ya bụ atụmatụ.

Na ntụnye nke ya, eze ọdịnala obodo Ụmụeri, bụ Igwe Ben Emeka fọrọ ekele n'ụkpa wee bunye Gọvanọ Obianọ maka igùzòbè na ịkwàdò atụmatụ ahụ, ma tòkwà ndị Ụmụeri ahụ bi na USA maka ịkwàdo ndebànye aha ndị okenye ruru otu narị n'ọnụ ọnụgụ.
O kpèkwazịrị ka Chineke gọzie ma kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji, ọbụnadị dịka ọ kpọkuru ndị ọzọ ka ha ñòmie nke ahụ site n'inye aka kwàdo ndebànye ndị ọzọ, n'ihi na ahụike bụ ihe onwunwe.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị ritara urù na nke ahụ, nke gụnyere Maazị Leonard Okeke na Oriakụ Caroline Igwe kèlèkwara ndị ahụ kwadoro ya bụ ndebànye aha maka afọ ọma ha nakwa ọrụ obi ebere ha, ma kpekwazie ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ha, inye ha ahụ ike na ibuli ha elu n'ihe dị iche iche ha na-eme na mba ofesi ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.