Ndị Umunnachi Ejirila Ọñụ Mee Emume Ede

Mar 6, 2021 - 14:52
 0
Ndị Umunnachi Ejirila Ọñụ Mee Emume Ede
Ndị Umunnachi Ejirila Ọñụ Mee Emume Ede
Ndị Umunnachi Ejirila Ọñụ Mee Emume Ede

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Ụmụnnachi dị n'okpuruọchịchị ime obodo Dunukofia nke steeti Anambra mere otu n'ime nnukwu mmemme e jiri mara obodo ahụ, bụ emume Ede (Ede Festival).

Ya bụ mmemme bụ nke dọtara ụmụafọ obodo ahụ na ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị iche iche wee bịa isonye na mmemme ahụ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi òtù ahụ jikọtara ndị ndu obodo dị iche iche na steeti Anambra a maara dịka 'Anambra State Association of Town Unions, ASATU' bụ Maazị Titus Akpudo kọwara Ndị Igbo dịka ndị nwere ọtụtụ omenala na ọnatarachi dị iche iche e jiri mara ha.

O kwere nkwà na òtù ahụ, n'okpuru ndu ya, ga-agbasi mbọ ike ma jikọọ aka ọnụ, ya na ọchịchị steeti Anambra, iji wee kwalite omenala ahụ dị iche iche e jiri mara Ndị Igbo na steeti ahụ, n'ihi ọtụtụ ụzọ dị iche iche nke ahụ ga-esi nye aka n'itute na ichekwaba omenala niile ahụ, na n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe, ọkachasị mmepe ime obodo dị iche iche.

Dịka ọ na-akpọku ndị obodo dị iche iche n'ime steeti ahụ ka ha na-akwàlite omenala e jiri mara ha ma na-emesi ha ike, o kwuru na òtù ASATU ga-achịkọba nnukwu mmemme nkwalite omenala na steeti ahụ n'ime ahọ a, iji gosipụtara mba ụwa omenala na ọnatarachi ndị ahụ Chineke jiri gọzie Igbo, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ kwàlite ịdịnotu na mmekọrịta n'etiti obodo dị iche iche na steeti ahụ

N'okwu nke ya, onyeisioche òtù Ohanaeze Ndigbo na steeti Anambra, bụ Maazị Emeka Udodeme kèlèrè aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, maka atụmatụ 'Akụ Ruo Ụlọ' ahụ o wepụtara, nà atụmatụ ndị ọzọ ọchịchị ya wepụtara iji mee ka steeti ahụ bụrụ ọkachamma ma na-adọtakwa ndị oji ego achụ ego sitere ebe dị iche iche, bụ nke ọ kọwakwara na ọ gụnyèkwàrà itute na ịkwàlite omenala na ọnatarachi ndị Igbo n'ogoogo mba ụwa; ma kpọzie òkù ka e jigidesie ya bụ atụmatụ ike.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ, nke gụnyere onye na-eme ejije a ma àmá, bụ Zubby Michael; na nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Obianọ n'ihe metụtara ndị ntorobịa, bụ Maazị Emeka Okonkwo, kpọkuru ndị Igbo ka ha jigidesie omenala ha ike, ma kpọkùkwa ndị ntorobịa ka ha tinye ike ha na ọnatarachi dị iche iche ha nwere n'ịkwalite mmepe obodo na omenala Igbo.

A nọrọ na óké mmemme ahụ tie mmanwụ, gbaa egwu ọdịnala ma mekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche mere ka ya bụ mmemme zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484