Ndị Ụmụowelle Agụlụ Emeela Mmemme Ịgba Ọfala

Feb 19, 2020 - 17:59
Jan 19, 2021 - 18:00
 0
Ndị Ụmụowelle Agụlụ Emeela Mmemme Ịgba Ọfala

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria.

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ nso-nso a dịka ndị ògìgè 'Idemili Cultural Centre' dị n'Ụmụowelle Agụlụ, n'okpuru ọchịchị steeti Anaọcha nke steeti Anambra mèrè emume ịgba ọfala. Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'isi ogìgè ndị òtù ahụ ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ụmụafọ obodo ahụ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi nchụaja ògigè ahụ, bụ Maazị Ralph Ndidi Obi kọwàrà na ebumnobi ya bụ emume bụ iji tute mmụọ na uche ndị mmadụ n'ebe Chineke nọ dịka onye kachasị ike na onye kachasị elu.

O mere ka a mara na Chineke na-aza ekpere ọbụla mmadụ jiri obi ọcha wee kpee n'ogige ahụ, ma kpọkuzie ndị mmadụ ka ha kaba ahụ nwee ezi aha, kwụba aka ha ọtọ ma bụrụkwa ndị eziokwu.

N'okwu nke ya, otu n'ime ndị enyi ògìgè ahụ, ma bụrụkwa Eze ọdịnala obodo Ụmụerum dị n'okpuru Ayamelụm, bụ Igwe Mike Udemezue kọwàra mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma dụzie onye ọbụla ka ọ na-asọpụrụ iwu na-achị ogìge ahụ, na-akwàdo ezi omenala e jiri mara ndị Igbo, ma na-atụkwa egwu Chineke n'ozuzuokè, n'ihi na ngọzị na-adịrị onye na-eme ndị etu ahụ.

Na ntụnye nke ya, otu nwa amadi jibụrụ ọkwa n'oge gara aga dịka onyeisi ụlọ mgbasaozi 'Anambra Broadcasting Service' bụ Maazị Ben Ekweọnụ kọwàpụtàrà etu ogigè ahụ na ụlọ ọrụ ahụ si emekọrịta ihe ọnụ kemgbe ụwa, ma kpọkuzie ụlọ mgbasaozi dị iche iche n'ala Igbo ka ha gaa n'ihu ịdị na-akwàlite asụsụ na omenala Igbo. O kpekwazịrị ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ogigè ahụ, ndị òtù ha, onyeisi nchụaja ha bụ Maazị Obi nakwa ndị ọzọ siri ebe dị iche iche wee bịa isonye na ya bụ mmemme.

Mmemme ịgba ọfala ahụ bụ nke weere ọnọdụ mkpụrụ ụbọchị atọ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee gbaa mgba, kpee usoro ekpere dị iche iche, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere ka ya bụ ụbọchị zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.