Ndi uwe ojii akpachigo mmadu abuo choro ibu agha iyi egwu megide ndi njem ugbo oloko na Toronto

Ndi uwe ojii akpachigo mmadu abuo choro ibu agha iyi egwu megide ndi njem ugbo oloko na Toronto

Apr 24, 2013 - 05:12
Jan 20, 2021 - 05:13
 0
Ndi uwe ojii akpachigo mmadu abuo choro ibu agha iyi egwu megide ndi njem ugbo oloko na Toronto

Ndị uwe ojii, ndị Royal Canadian Mounted Police, RCMP n’aha ịchafọ, ejidogo mmadụ abụọ a na-ebo ebubo na ha na-akpa nkata ibuso ndị njem ụgbọ oloko agha iyi egwu na Toronto.

Mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu n’ụbọchị Mọndee, osote onye isi ndị uwe ojii, James Malizia, kwuru na ha jidere ụmụ nwoke abụọ, Chiheb Esseghaier, gbara afọ 30, ya na Raed Jaser, gbara afọ 35. Chiheb bi na Montreal ebe onye ogbo ya bu Raed bi na Toronto.

Ndị uwe ojii na-ekwu na, site na enyemaka ndị otu Alkaida na mba Iran, mmadụ abụọ ndị ahụ na-akpa nkata maka iji egbe na mgbọ ogbunigwe wakpo ụgbọ oloko si Toronto aga New York.

Malizia gwara ndị nta akụkọ n’o tego aka ndị uwe ojii ji eso ụmụ nwoke abụọ ahụ, na-enyocha akparama agwa ha, na-akpara ha ọnya. Ọ gbakwụnyere sị na Chiheb na Raed akpachagorị nkata, ma dịzie njikere igbu ọtụtụ ndị njem ụgbọ oloko si Toronto aga New York. Ndị uwe ojii malitere ịnyocha akparama agwa mmadụ abụọ ahụ n’ọnwa August afọ 2012.

Taa bụ Tuzdee, a gbara Chihed na Raed akwụkwọ n’ụlọ ikpe na Toronto. E kpebiri ịhapụ ha n’ụlọ nga na Toronto ruo n’abalị 23 nke ọnwa Mee, oge a ga-amalite ikpe ha ikpe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.