Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Mmadụ 113 Maka Òtù Nzuzo Na Ịpụnara Mmadụ Ụgbọala N'Ike

Mar 28, 2019 - 22:19
Jan 21, 2021 - 22:19
 0
Ndị Uwe Ojii Anambra Ejidela Mmadụ 113 Maka Òtù Nzuzo Na Ịpụnara Mmadụ Ụgbọala N'Ike

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ndị uwe ojii na steeti Anambra ejidela mmadụ ruru ótù nàrị na iri na atọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị òtù nzuzo na ndị na-apụnara mmadụ ụgbọala ha n'ike. Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Rabiu Ladodo mere ka a mara nke a n'okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ oge a na-akpụgharị ndị ahụ, bụ ndị o kwùrù na e jidèrè n'ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti ahụ.

O kwuru na mkpocha na nzacha ahụ e sìrì na ya wee nwụchikọọ ndị ahụ bụ nke e mere site n'aka ndị òtù ọrụ nchekwa ahụ pụrụ ichè na-ebu agha megide otu nzúzo, bụ 'Anti-Cult', n'ọrụ ha gàrà n'ime izuụka abụọ.

O mere ka a mara na a kpụpụla mmadụ iri anọ na ise n'ime ha ụlọ ikpe, tọhapụ mmadụ iri atọ na ise aka ha dị ọcha ka ha laba, ebe a ka na-enyòchakwa mmadụ iri atọ na atọ fọrọ afọ. Ọ sị na ihe e nwèkọtara n'aka ndị ahụ gụnyere: ótù nsụnsụ egbè, ogologo égbè asaa mgbọ dị na ha, ọtụtụ anyụike, mma ògè, na akwụkwọ kpọrọ nkụ a na-enyo ènyò na ọ bụ ìgbó.

O kwuru na ụfọdụ n'ime ndị ahụ bụ ndị na-apụnara mmadụ ụgbọala n'ike, bụ ndị a nàpụtara ụgbọala asatọ ha zutere ezute n'aka ha. Ndị ahụ ka ọ kọwara dịka Paul Chukwuezugo gbara ahọ iri anọ na abụọ na onye òtù ya bụ maazị Micheal Obinna, onye a maara dịka Mayor. O kwuru na ihe e nwèkọtara n'aka ndị ahụ bụ ụgbọala asaa, nke gụnyere: ụgbọala Toyota Venza, ụgbọala Lexus 350 atọ, otu ọkwụọtọ ekele eze Toyota Rav 4, Toyota Corolla atọ na ụgbọala Sports Utility Vehicles (SUV).

Ihe ndị ọzọ e nwètara n'aka ha gụnyere otu nsụnsụ égbè na-agba ọnụ iri, otu mma ògè na ekwentị anọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.