Ndị Uweojii Azọpụtala Dọkịta Ndị Omekoome Tọọrọ, Jide Ndị Ntọ Ahụ

Nov 27, 2021 - 22:30
 0
Ndị Uweojii Azọpụtala Dọkịta Ndị Omekoome Tọọrọ, Jide Ndị Ntọ Ahụ


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachaara abalị olenaole e jiri tọrọ ya, ndị uweojii n'ime steeti Cross River zọpụtàrà Dọkịta Edmund Akpaikpe ma nwụchikọọ ndị ntọ mmadụ atọ tọọrọ ya n'obodo Esigi dị n'okpuruọchịchị Bakassi nke steeti ahụ.

Ya bụ dọkịta bụ onye ọrụ ahụike na-arụ n'ụlọọgwụ 'Irua Specialist Hospital' dị na steeti Edo, ma bụrụkwa onye a tọọrọ n'ụzọ oge ọ na-ebula nwaodibọ ya n'obodi Esigi ụbọchị ụka gara aga.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ DSP Irene Ugbo bụ ya kwupụtara nke ahụ n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a.

O kwuru na oge ndị uweojii nwetere ozi banyere ntọrọ ahụ a tọọrọ nwa amadi ahụ, onyeisi ngalaba ọrụ uweojii na-ahụ maka ihe gbasaara ịtọrọ mmadụ na otu nzuzo, bụ 'Anti Kidnapping and Cultism Squad' (a maara dịka Dragon), bụ SP Abdulhameed Awodi dùùrù ndị otu ya wee banye n'ọrụ ozigbo, ma chọgharịba ndị ahụ mbiaka mbiaka.

Ngwangwa ndị ntọ ahụ nwètàrà ozi na mmetụta na a na-achọ ha aka-ọkụ aka-ọkụ, ha bihapụrụ nwoke ahụ ozigbo ma rie mbọmbọ ọsọ maka ndụ ha. Ha hapụkwàrà ụgbọala Toyota Camry nwoke ahụ, wee rie mbọmbọ ọsọ; ndị uweojii ahụ weebutekwa ya ma zọpụtakwa nwoke ahụ ụbọchị Tuzdee.

Ọ gakwazịrị n'ihu kọwaa na anwụchikọrọ ndị ntọ atọ aka ha dị n'arụrụala ahụ, nke gụnyere Samuel Ime Thompson (gbara ahọ iri abụọ na ise), Kingsley Mbetobong (gbara ahọ iri abụọ na atọ), na Asuquo Ekpo Etim (gbara ahọ iri abụọ isii).

O kwukwazịrị na ndị ahụ e jidere na-enyere ndị uweojii aka na nnyocha, site n'inye ha ozi dị mkpa ha ga-eji wee nwụchikọọ mmadụ abụọ ndị òtù ha fọrọ afọ; ọbụladị dịka ọ kọwakwara na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma e mechaa nnyòcha banyere arụrụala ha.

O kèlèkwazịrị ndị uweojii ahụ maka ezi ọrụ ha na agbambọ ha ịnwụchikọ ndị omekoome ahụ na ịzọpụta dọkịta ahụ na ndụ.

Ọ katọkwazịrị etu ntọrị mmadụ ohi na arụrụala ndị ọzọ dị icheiche sizị arị ibe ha elu, ọkachsị ugbua a na-achọ ịbanye n'oge mmemme ekeresimeesi, bụzị oge ndị mmadụ ji etinye aka n'ụdị ihe dị icheiche iji bute ego mbute.

Ọ gwara ndị omekoome na ndị ọbụla na-etinye aka n'ụdị mpụ na arụrụala dị icheiche n'ime steeti ahụ ka ha kwakọrọ ngwongwo ha chègharịa maọbụ pụọ kpamkpam na steeti ahụ ozigbo, n'ihi na ha bụ ndị ọrụ nchekwa ga-aga n'ihu ibuso ha agha dị egwu na imemìlà ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484