Ndị Uweojii Ejidela Ndị A Na-Enyo Ènyò Na Ha Bụ Ogbu Mmadụ n'Abuja

Oct 19, 2021 - 22:59
Oct 19, 2021 - 23:08
 0
Ndị Uweojii Ejidela Ndị A Na-Enyo Ènyò Na Ha Bụ Ogbu Mmadụ n'Abuja

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii akpàrala mmadụ atọ a na-enyo enyò na ha bụ ogbu mmadụ, ma bụrụkwa ndị aka ha dị n'ọnwụ nwoke ahụ a mà àmá na-esi nri gwòògwòò n'Abuja, bụ Maazị Vincent Eluagu Chukwuemeka, onye e ji 'Chef Emeka' wee mara.

Ọ dị ncheta na a hụrụ ozu Chef Emeka n'ime be ya dị n'Abuja, n'abalị iri abụọ nke ọnwa Ọgọstụ ahọ a n'Abuja bụ isi obodo ala Nigeria.

Nke a mezịrị ndị uweojii, ngalaba FCT jiri màlite ime nnyocha miri èmì banyere ọnwụ mberede nwa amadi ahụ, ji chọpụta ka o siri nwụọ, ihe kpatara ọnwụ ya, maọbụ ndị aka dị na ya bụ ọnwụ.

N'ozi a kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a n'Abụja site n'aka onye na-ahụ mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na FCT, bụ DSP Josephine Adeh, e mere ka a mara na ndị uweojii ahụ anwụchiela mmadụ atọ a na-enyo ènyò na aka ha dị n'ọnwụ nwa amadi ahụ. 

Ọ kpọpụtasịrị aha ndị ahụ dịka Kingsley Obinna (gbara ahọ iri abụọ na anọ), Musa Tanimu (gbara ahọ iri abụọ na ise) na Mohammed Sha’aba (gbara ahọ iri abụọ na isii).

Ọ kọwara na site na nnyocha ndị na-ahụ maka igbu ọchụ ụlọ (homecide) na ngalaba 'Criminal Investigations Department (CID)' mere, na a chọpụtara etu ndị ahụ siri wee gbuo nwoke ahụ n'ụlọ be ya.

O kwukwazịrị na onyeisi ndị uweojii na FCT, bụ CP Babaji Sunday akasiela ma ka na-akasìkwa ndị ezinụlọ na ndị enyì nwoke ahụ obi, na-àgbàkwa ha uwe ka ha kara obi, n'ihi na ha ga-enweterịrị ikpe nkwụmọtọ.

O kwekwara nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma e mechaa nnyocha banyere ihe ahụ ha mere; ọbụladị dịka ọ dụkwàzịrị ndị mmadụ ọdụ ka ha na-enye ha mkpesa na ozi dị mkpa oge ọbụla ha hụrụ onwe ha n'ọnọdụ ntụmadụ na ọnọdụ ndị ọzọ dị añaa, site n'ịkpọtụrụ ákàrà 08032003913, 08061581938, 07057337653 maọbụ 08028940883.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484