Izunna Okafor

Igbo sị na anụ enweghị ụkwụ anaghị abọ aja, maka na anụ enweghn ụkwụ anọ abụghị anụ ụkwụ anọ.

Ka ọ dị taa, a kpọkuola ndị nwere ụlọ oriri na ọñụñụ na mpaghara ebe dị iche iche na steeti Anambra ka ha gbaa mbọ debànye aha n'akwụkwọ ma na-azụkwa ahịa ha n'ụzọ iwu kwàdòrò.

Oku a bụ nke a kpọrọ Kọmishọna na-ahụ maka omenala na njem nlegharịanya na steeti Anambra, bụ Dọkịta Christian Mmadụbuko, n'okwu ya na mmemme ọgbakọ ọzụzụ mkpụrụ ụbọchị atọ a chịkọbàrà maka ndị nwere ụlọ oriri na ọñụñụ na steeti ahụ, bụ nke bịara na njedo na nsonso a. 

Ọ kọwaara ha mkpà ọ dị na onye ọbụla nwere ụlọahịa maọbụ ọdụahịa na steeti ahụ kwesìrì idebànye aha n'akwụkwọ, ma makwara ha na onye ọbụla edebànyeghị aha n'akwụkwọ ga-abụ onye a ga-akpọchi ụlọahịa ya.

Kọmishọna Madụbuko jikwàrà ohèrè ahụ wee gwa ndị ahụ ka ha na-aga n'ụlọọrụ 'Anambra State Small Business Agency' (ASBA) maka ịgbaziri ego iji kwàlite azụmahịa ha, n'ihi na nke ahụ so n'ebumnobi ma bụrụkwa isi sekpụ ntị Gọvanọ Willie Obianọ jiri guzobe ụlọọrụ ahụ.

Ọgbakọ ọzụzụ mkpụrụ ụbọchị atọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ọgbọ nta nkwàdo atọ e nwere na steeti ahụ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kụzikwara ndị ahụ etu ha ga-esi na-edobe gburugburu ebe ha na-ere ihe oriri ọcha, etu ka ga-esi na-enye ihe oriri n'ezi ọnọdụ adịmọcha bụ ịgbà, etu ha ga-esi na-akwàlite ọnụ ego ha na-enweta n'azụmahịa ha, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ kwàlite ego na-abata n'akpa ego gọọmenti steeti ahụ, tinyere ihe ndị ọzọ a kụziiri ha.

YOUR REACTION?