By Chidi Igwe, VON

Ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ịhụ na anụ ahụ ha mara mma n’anya. Nchọcha ndi ntaakụkọ mere gosiri na mmetọ ikuku Bekee kpọrọ “pollution” so n’ihe na-eme ka ahụ mmadụ ghara ịna akwọ mụrụ mụrụ.

Ihe ọzọ bụ ajọ ude nakwa ihe otite ndị ọzọ, nri nakwa ahụike onye ahụ.

E nwekwara ebumpụtaụwa ihe ndị ọzọ na-esokwa ebute mgbanwe n’ahụ mmadụ dịka nka.

Ihu nhịkọ maọbụ akara nka Bekee kpọrọ “wrinkles” so na ebumpụtaụwa nke onweghị ihe ihere dị na ya.

Mana ọ bụrụ na nsogbu gị bụ ahụ gị ịkwọ mụrụmụrụ, lekwa ihe ndị ị ga-etinye anya na ya.

Mgbe ndi ntaakụkọ kpọtụụrụ ọkammụta gbasara nlekọta akpụkpọ ahụ na UNTH Enugwu bụ Ọkammụta Uche Ojinmah ka ọ waa anyị anya maka nke a.

Gere ọnụokwu Dọkịnta Uche Ojinmah

Ọ kọwara na akpụkpọ ahụ mmadụ niile abụghị ofu.

Ebe ọ dị mfe ịme ka ụfọdụ kwọọ mụrụmụrụ ozigbo, ọ na-ahịa ndị ụfọdụ ahụ.

Ebe ụfọdụ sị n’afọ dị mma, ụfọdụ kwesiri ịlekọta anya.

O kwuru na ahụike mmadụ na-egosikwa na ahụ ya maka ọbara adịghị n’ahụ, okpo maọbụ ịba nwereike ịme ka anụ ahụ mmadụ dị njọ.

Ihe ndị ị kwesiri ị na-eme mgbe niile

Otu i si ebi ndụ na-emetuta ahụike gị dịka o si emetụkwa anụahụ gị.

Ihe ndị a anyị ga-agụpụta ga-enye aka ịme ka ahụ gị na-akwọ mụrụmụrụ, dịka Ojinmah na dị ọkachamara ndị ọzọ kwekọrịtara:

1) Na-aṅụ mmiri nke ọ ma

Ọ bụ eziokwu na odosighi anya ka ịṅụ mmiri si ebute ahụ ịkwọ mụrụmụrụ mana mmụta gosiri na ịṅụ mmiri nke ọma na-eme ka ahụ mmadụ na-akwọ mụrụmụrụ.

Ịṅụ mmiri na-eme ka ahụ mmadụ na-adọ adọ, mee ka ọ ghara ịkpọ oke nkụ maọbụ dị njọ n’anya.

Ojinmah kwere na ịṅụ mmiri na enyeaka n’ịdozi ahụ mmadụ.

2) Iri nri na-edozi ahụ

Nri na-edozi ahụ na-egbochi anụahụ ịka nka ọsịsọ. Nri ndị a gụnyere akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi na azụ salmọnụ.

Nchọcha gosikwara na-ịṅụ mkpụrụ ọgwụ ụfọdụ Bekee kpọrọ ‘probiotics’ nwekwaraike itinye ezigbo nje na-egbu nkwọ, ọkọ pimpụl maọbụ ahụ mgbachụ sitere n’anwụ.

3) Ịmegharị ahụ (Exercise)

Nchọcha emere na mmadụ nakwa ahụ anụọhịa gosiri na ịmegharị ahụ n’ụdị ga-eme ka ikuku ndụ bata mmadụ n’ahụ Bekee kpọrọ aerobics na-eme ka anụahụ mmadụ dị mma.

Ọ na-eme ka elụahụ mmadụ ghara isiike ma mee ka ime ahụ onye ahụ sie ike. Nka na-ebugharị ọnọdụ a, mee ka eluahụ sie ike ma mekwa ka imeahụ ghara isiike.

Nke a na-eme ka ahụ onye ahụ dị mma anya ma dịkwa ka nke nwata.

4) Ị rahụ ụra nke ọma

Nke a ga-abụ ihe mmgbagwoju anya nye ụfọdụ, mana nke bụ eziokwu bụ na ụra na-edozi ahụ mmadụ.

Ahụ mmadụ na-edozi onwe ya mgbe onye ahụ nọ n’ụra.

Ọ na-enyekwa aka ọbara ikwo nke ọma n’ahụ ma meekwa ka ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ dịka nke Bekee kpọrọ Collagen.

Ọ bụ ihe nwereike ịmezi ahụ anwụ chagburu maọbụ mee ka ahụ nhịkọ belata.

5) Igbochi anwụ ịcha gị n’ahụ

Oke anwụ na-agbachu mmadụ ahụ ma na-ebutekwa ahụ ịkpọnkụ, nka mberede maọbụ ọrịa kansa anụahụ.

Na-ete ude gana ekpuchi ahụ gị anwụ Bekee kpọrọ sunscreen, gbaara oke anwụ ọsọ ma kpuchikwaa ahụ gị.

Nchọcha gosiri na mmadụ ịgba onwe ya n’anwụ mgbe niile dị njọ karịa anwụ ịcha onye ahụ. Gbaara ya ọsọ.

6) Esekwala anwụrụ

Anwụrụ sịga, nke e sere ese maọbụ nke kusara mmadụ n’ahụ nwereike ibutere onye ahụ nka mberede, ihu nhịkọ maọbụ ọrịa anụahụ dịka ọkụ maọbụ akpụkpa.

Ọ na-emekwa na anụahụ onye ahụ agaghị agwọli onwe ya.

Gbaa mbọ kwụsị ịse sịga maọbụ anwụrụike ndị ọzọ.

7) Ịṅụ oke mmanya

Nọchacha gosiri na ịṅụ oke mmanya na-eme ka anụahụ mmadụ hịkọọ.

Ịṅụ oke mmanya na-emekwa ka mmiri taa mmadụ n’ahụ nke na-ebutekwa ahụ nhịkọ.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ahụ gị na-akwọ mụrụmụru, ị ga-ebeleta oke mmanya.

Ihe ndị gboo ji achọ mma

Ojinmah kwuru na ọtụtụ ihe ndị gboo ji achọ mma anaghị emeru mmadụ ahụ maka na ha bụ ọnatara chi.

Ọ sị na nzụ na-eme ka mmiri dị n’akpụkpọ ahụ, na ajụkwa anụ ahụ oyi, ma mee ka ọkọ benata n’ahụ.

O kwuru na “Uhie bụ maka naanị ịchọ mma. Ọnweghị ihe ọzọ ọ na-eme”.

Ube Bekee nwere ụmụ ihe dịcha n’ime ya na-enyeaka aka ka anụ ahụ ọhụrụ na-apụta.

Ojinmah kwetere na ube Bekee nwere ụmụ vitamin dị na ya na-edozikwa ahụ.

Mana ọ dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla na-ego mmanụ akị, ube na ụmụ akụkụ (Plant) ndị ọzọ kpachara anya maka adịgboroja.

Ọ dọrọ aka na ntị a maka ndị na-ego “organic” bụ nke ọ sị na ka e si eme ụfọdụ n’ime ha ezighị ezi.

Ọ sị na ndị nje bara nwereike ibute ọrịa ndị ọzọ atụghị anya.

Ihe ndị ọzọ ị ga na-eme

YOUR REACTION?