Izunna Okafor

Ndị uweojii steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee nwụchie ụmụokorobịa abụọ na-ama aka àkpà n'Ọnịtsha, bụkwa ndị na-etinye aka n'arụrụala ndị ọzọ dị iche iche na-ewèta ala adịghị mma.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ Maazị Haruna Mohammed siri kọwaa, mmadụ abụọ ahụ bụ ndị a nwụchiri na mpaghara Ogidi/Nkpor/Tarzan na Umunya.

Ọ kpọpụtara aha mmadụ abụọ ahụ dịka Maazị Chukwuemeka Ikechukwu (gbárá ahọ iri abụọ na abụọ ma birikwa na mpaghara ụzọ Chibest dị na Tarzan), na Maazị Tochukwu Okeke (gbara ahọ atọ, ma bụrụkwa onye obodo Nkwelle Ukeh dị n'okpuru ọchịchị 'Idemili North' nke steeti Anambra) 

O kwuru na ndị ahụ so na ndị zugoro ọtụtụ ohi dara ụdà, maa aka àkpà, ma pụnarakwa ndị mmadụ ekwentị ha n'Ogidi, Nkpor, Tarzan, Umunya, Odomodu na mpaghara gburugburu Ọnịtsha niile.

Ọ sị na ihe e nwetagasịrị n'aka ndị ahụ gụnyere égbè abụọ, nsụnsụ mmà, àkpà abụọ, ekwentị iri na abụọ, otu àkpà aka oge okwu ekwentị (recharge cards) juru na ya, ego dị narị puku naịra abụọ na iri iteghete na iri (N296,000), otu Keke (nwere ákàrà NSH 299 QH), ìgbé ego juru n'ime ya, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ, bụ nke ha pụnahịsịrị ndị mmadụ n'ike.

Ọ kọwara na a ka na-eme nnyocha banyere ndị ahụ na ohi niile ahụ ha zùrù, nke mgbe e mechara ya, a kpụpụ ha ụlọikpe.

N'okwu nke ya, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP John Abang kèlèrè Ndị Anambra maka ezi agbambọ, njikọaka na enyemaka ha na-enyere ndị uweojii n'ọrụ ibuso ohi, mpụ na arụrụala agha na steeti ahụ, ọkachasị site n'inye ha ozi na-enyere ha aka ịnwụchi ndị omekéòmè. Ọ dụrụ ha ka ha jisie ike n'ime nke ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkùrù ha ka ha ka onye ọbụla hie asaa naabọ n'anya etu o si eme ihe, ọkachasị ugbua a batagoro n'ime ọnwa mba, bụ mgbe mpụ na arụrụala ji abawanye ụba.

YOUR REACTION?