By Izunna Okafor

N'iji sị ha nọtụkwuo, ndị omeiwu steeti Anambra, agbatịkwuola oge ọchịchị ndị isi oche nchere oge okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ.

Mgbatịkwu oge ọnụnọ ahụ bụ nke e kwupụtara n'ogigè ụlọ omeiwu ahụ oge ha nwere ọgbakọ, bụkwa nke a nọrọ kwuru na ọ ka ndị isi nchere oge ahụ nọkwuo ọnwa atọ ọzọ. Ya bụ mgbatịkwu oge bụ nke e mèrè n'ịgbasò mpaghara iri (section) 208 nke amụma iwu okpuru ọchịchị ime obodo nke ahọ 1999, ma bụrụkwa nke Gọvanọ Willie Obianọ rịọrọ ka e mee.

N'okwu ya n'ọgbakọ ahụ, Ọkaokwu ụlọ omeiwu ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor kpọkùrù ndị isi oche nchere oge ahụ ka ha gbasie mbọ ike ịdọta mmepe na èrèrè ọchịchị onye kwuo uche ya n'okpuru ọchịchị ha dị iche iche.

Ọ dụkwara ha dụkwàzịrị ha ka ha dị uchu n'ọrụ ha ma gbasie mbọ ike rụpụta ihe a hụrụ anya, ọbụnadị karịa karịa ka ha mere na mgbe gara aga, iji nye aka n'ịkwàlite ya bụ ezi mbọ esepughị aka Gọvanọ Obianọ na-agba n'ịkwàlite steeti ahụ ka ọ bụrụ eji ama àtụ. Ọ rịọkwara ha ka na ndị nnọchianya ha n'ụlọ omeiwu ahụ na-ejikọ n'ọrụ n'ihe dị iche iche ha na-eme, ọkachasị n'itinye iwu ọrịa korona n'ọrụ n'ime obodo dị iche iche n'okpuru ọchịchị ha.

N'okwu ha dị iche iche, ụfọdụ ndị isi oche nchere oge ahụ, nke gụnyere Maazị Chieloka Okye nke 'Nnewi South', na Maazị Raphael Nnabụife nke 'Idemili North' kèlèrè Gọvanọ Willie Obianọ maka inye ha ohere ọma ọhụụ ahụ iji tụnyekwuo ụtụ nke ha dịka ndị isi oche okpuru ọchịchị ha dị iche iche, ma kwezie ya kwa ịrụ ọrụ nke ọma karịa ka ha rụrụ na mbụ.

YOUR REACTION?