N'Ebenator, Ezenagụ Ekesàárala Ndị Mmadụ Akpa Osikapa Ruru 300

Jul 12, 2021 - 22:18
 0
N'Ebenator, Ezenagụ Ekesàárala Ndị Mmadụ Akpa Osikapa Ruru 300

Izunna Okafor dere akụkọ a


Onye na-etinye ọchị n'ihu nwaogbenye na-etinye ọchị n'ihu chi kere nwaogbenye.

N'ịgbaso nke a, otu nwoke ọrụ obi ebere na-echu ụra, bụ Maazị Gilbert Ezenagụ etinyela ọchị n'ihu ọtụtụ mmadụ site n'iji akpa osikapa wee kwàdó mmadụ ruru narị atọ n'ọnụọgụgụ, bụ ndị ọnọdụ dịịrị añaa, n'obodo ya bụ Ebenator, n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' nke steeti Anambra.

Ọ nọkwara na mmemme ahụ wee kesàára ndị ahụ ego iji goro ihe ha ga-eji wee hazie ya bụ nri, ka erimeri wee bụrụ mkpori mkpori. 

N'okwu ya banyere nke ahụ, Maazị Ezenagụ kọwara na mmadụ inyere onye ọnọdụ dịịrị aña aka na-atọ Chineke ụtọ nke ukwuu, ma na-adọtakwa ngọzị na ihuọma Ya, tinyere ọtụtụ ezi ihe ndị ọzọ na Chineke na-emere onye dị etu ahụ, maka na Ọ bụ Ya bụ Onye na-akwụ ụgwọọrụ.

Dịka ọ na-akọ akụkọ ụwa banyere ihe Chineke meere ya na etu O siri gọzie ya, o mere ka a mara na ọ bụ site n'aka onyeisi ụlọụka 'Synagogue Church of God' , bụ onye amụma Temitope Balogun a maara dịka T.B. Joshua, bụ onye nwụrụ na nsonso a ma bụrụkwa onye e meere emume ịmụ ọkụ abalị na nsonsoa a.

Dịka o siri kọwaa, onye amụma T.B. Joshua bụ ezi onye ozi Kraịstị soro nzọụkwụ Ya nke ọma wee ruo n'ọnwụ ya, ma bụrụkwa nwoke ọ mụtara ọtụtụ ihe n'aka ya oge ọ dị ndụ, ọkachasị mmụọ na obi e ji enye enye, bụkwazị nke gbadoro ụkwụ n'akwụkwọnsọ na n'ụkpụrụ Kraịstị tọgbọọrọ na nkuzi o nyere ndị na-eso ụzọ ya.

O mere ka a mara ka a mara na otu n'ime ihe kpaliri ya o jiri kesàá ihe ndị ahụ o kesàrà bụ agụụ, maka na ọ chọpụtara na agụụ so n'otu n'ihe na-ebi ndị mmadụ aka Nigeria ọjọọ n'ala Nigeria, maka na ezigbo agụụ dị n'obodo ugbua, tinyekwuoro na onye agụụ na-agụ bụ onye iwe na ewe. O kwuru na ndị China bara ụba nke ukwuu ma bụrụkwa ndị kacha wee dị ụbara nmana nri dị ọnụ ala ebe ahụ, bụzị nke mere na agụụ anaghị enye ụmụ mmadụ n'ebe ahụ dịka ọ dị n'ala Nigeria.

Ọ kọwara na ihe agụụ jiri bụrụ nnukwu nsogbu abụghị naanị na ọ na-emekpà ụmụ mmadụ ahụ, kama na ọ na-emekwa ka mmadụ na-etinye aka n'ime aka ntụtụ, izu ohi, na itinye aka n'ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ na-eweta ala adịghị mma.

Maazị Ezenagụ, onye rụgooro ndị mmadụ ọtụtụ ọrụ obi ebere ma mekwa ọtụtụ ezi ihe dara ụda n'obodo, kwuru na ọ naghị enwekarị mmasị ikwe ka mmadụ na-abịakarịa be ya ịbịa ekele ya maka ihe ọma o meere ya, n'ihi na ọ na-ele anya na ọ bụ Chineke ka ọ dịịrị ya ịkwụ ya ụgwọ na ikele ya na ile a ọrụ maka ihe o mere. Ọ sị na ya anaghị enye maka na ọ bụ ya kachara ba ọgaranya, kama na ọ chọpụtara na inyere mmadụ aka bụ otu ụzọ kachasị ụzọ mmadụ pụrụ isi wee kwue 'Isee' (Amen) nye ekpere ọbụla ọ na-ekpe, nke bụkwa ihe ọ mụtàrà site n'aka onye amụma T.B. Joshua.

Ọ kpọkukwara ndị ọzọ bụ ndị akajiakụ ka ha nwee mmụọ inye inye, ghọtakwa mkpa ọ dị inye inye n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche dị na nke ahụ. Ọ dụrụ ndị ahụ Chineke jiri akụnụba wee gọzie ọdụ ka ha léghàra anya n'etu ndị mmadụ nwere ike isi jiri ha na-akụ asịrị, na-akọtọ ma na-akatọ ha n'ihi ọrụ ọma ha na-arụ na etu ha si enyere ndị mmadụ aka, n'ihi na e kwutọkwàrà Kraịstị n'onwe ya, mee ya akaje dị iche iche maka ọrụ ọma ọ rụrụ na ezi ihe o meere ndị mmadụ oge ọ nọ n'ụwa, nke pụtara na onye ọbụla chọrọ ịgbasò nzọụkwụ Kraịstị ga-eme ya n'eleghị anya n'azụ.

O gisipụtara ezi olileanya o nwere na T.B. Joshua anwụghị anwụ, maka na Chineke ka ji ya arụ ọrụ dị ukwuu n'ụlọụka ya nà ná ndụ ụmụ mmadụ ọbụladị ahụ ya dara n'ụra ọnwụ. 

Ọ gwakwara ndị ahụ ketere òkè n'ihe ahụ o ka ha ghọta na ọ naghaị eme ihe ahụ maka na ọ bụ ya kachara nwee ego, mana ọ bụ otu n'ime ụzọ o kpebiri isi jiri akụnụba ya wee jeere Chineke ya ozi.

O kwekwàrà nkwà na ọ ga-aga n'ihu n'ọrụ ọma ahụ ọ na-abàgide, maka na o nwere ezi olileanya na ụgwọọrụ ya si n'aka Chineke ala. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484