NEMA Ekesaarala Ndi Iju Mmiri Dabidoro n'Anambra

Feb 7, 2020 - 00:21
Jan 24, 2021 - 01:46
 0
NEMA Ekesaarala Ndi Iju Mmiri Dabidoro n'Anambra

Izunna Okafor, Awka

Ọnụ ọchị wàrànnọọ ndị ahụ nsogbu iju mmiri metụtàrà na steeti Anambra n'ahọ 2019, dịkà ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbanụgbanụ n'ala Nigeria, bụ ụlọ 'National Emergency Management Agency' (NEMA), ngalabà ya nke mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ gbàpèrè atụmatụ ikesàrà ha ihe oriri na ihe dị iche iche e ji akwàlite ọnọdụ obibi ndụ.

Ya bụ atụmatụ bụ nke a gbàpèrè site n'aka onyeisi ụlọ ọrụ ahụ na mpaghara ahụ, bụ Maazị Fred Anụsịm, nke ọ bụ òsòtè ya, bụ Oriakụ Eyiuche Aniagor nọchìtèrè anya ya; ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọakwụkwọ 'Father Joseph Memorial School Aguleri' dị n'okpuru ọchịchị Anambra East.

N'okwu ya na mmemme ịgbape atụmatụ ahụ, ya bụ onyeisi NEMA kọwàrà na ọ bụ gọọmenti etiti ala anyị tụkọtara ya bụ ihe, ma bụrụkwa nke e mere n'okpuru ụlọ ọrụ ahụ, oge ha na ngalaba ụlọ ọrụ ahụ na steeti Anambra tụchàrà arò ma meekwa ụfọdụ nnyocha.

Ọ kpọkùzịrị ndị ahụ ka ha nabàta ihe ndị ahụ dịka ihe iti aka n'obi, ma rịọkwa ha ka ha na-eke nkwụcha, na-aña ntị ma na-adịkwa njikere maka iju mmiri oge ọbụla n'ihi na hụ bụ ndị bi n'akụkụ mmiri.

N'okwi nke ya oge ọ na-anabàta ihe ndị ahụ n'ahà ndị e bùtèèrè ya, onyeisi ụlọ ọrụ 'State Management Agency' (SEMA) na steeti ahụ, bụ Maazị Paul Odenigbo kèlèrè ụlọ ọrụ SEMA na gọọmenti etiti maka mgbata ọsọ ahụ, ma dụọkwa ha ka ha jisie ike n'ọrụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi oche nchere ogè n'okpuru ọchịchị Ayamelụm, bụ Maazị Benjamin Onyeabọr kèlèkwara gọọmenti etiti na ụlọ ọrụ NEMA, ma kpọkuokwa ndị ahụ nọchitere anya ndị ritara urù na ya bụ ihe ka ha gbakwa mbọ hụ na ihe ndị ahụ rutèrè ndị e mèbèèrè ya aka, dịka ha si eme na mbụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.