Ngaghari iwe kpu oku n’onu n’aga n’ihu ugbu a n’Istanbul

Jun 17, 2013 - 05:32
Jan 21, 2021 - 18:18
 0
Ngaghari iwe kpu oku n’onu n’aga n’ihu ugbu a n’Istanbul

Ọgba aghara dị egwu na-eme na mba Turkey kemgbe izu ụka gara aga, tụmadị n’obodo Istanbul, ebe ndị uwe ojii n’igwe mmadụ ndị na-eme ngagharị iwe na-achịpụ ya.

Ndị ahụ na-eme ngharị iwe malitere na-akpa aghara. Onye Prime Minista mba Turkey, Tayyip Erdogan, zigara ndị uwe ojii ka ha chụsasịa igwe mmadụ ahụ gbakọrọ n’ogige Taksim Square na-eme ngagharị iwe n’Istanbul.

Nke a butereziri nnukwu ọgba aghara. Ndị ngagharị iwe malitere tụwa ndị uwe ojii okwute. Ndị uwe ojii na-atụzị ngwa ọgụ tia gasị aghara aghara. Ha chịpụtara akara ngwa katapila ndị e ji agba mmiri, were mmiri na-agba ndị ahụ na-eme ngagharị iwe. Ihe e nweziri ugbu a n’Istanbul bụ ọnọdụ ọkụ sị ite pụọ ite sị ọkụ pụọ n’etiti ndị uwe ojii na ndị ahụ na-eme ngagharị iwe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.