Nhọpụ̀ta Ọchịchị Anambra: Lee Ka O Siri Zòó Ma Gbachaa

Nov 12, 2021 - 23:53
Nov 13, 2021 - 20:10
 0
Nhọpụ̀ta Ọchịchị Anambra: Lee Ka O Siri Zòó Ma Gbachaa

Izunna Okafor dere akụkọ a 

Oke itimkpu ọñụ dara n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị Wenezdee, oge ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị, bụ ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission (INEC)' kwuwàrà ma kpọpụta Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo dịka onye tuuru ùgò na nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ ahụ e mere na steeti Anamba na nsonso a.

Ọ bụ onye ji ọkwa 'Returning Officer' maka nhọpụta ọchịchị ahụ ma bụrụkwa onyeisi Mahadum Calabar, bụ Ọkammụta Florence Obi kpọpụtara ya bụ mpụtara ikpeazụ nke nhọpụta ahụ n'isi ụlọọrụ INEC dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-akpọpụta mpụtara ahụ n'Awka, ya bụ Ọkammụta, onye nyere nkọwa banyere etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ na ya bụ nhọpụta, mèrè ka a mara na ọ bụ ụbọchị ụka ka a malitere kpọba mpụtara ntụliaka ahụ, mana a kpọruzịghị ya n'isi n'ihi na a tụghị akwụkwọ n'Ihiala, nke pụtara na atụmakwụkwọ ahụ ezughị òkè. Ọ bụ nke a mezịrị e jiri wee hibegharịa ụbọchị Tuzdee, abalị iteghete nke ọnwa Novemba dịka ụbọchị a ga-emegharị nhọpụta ọchịchị n'okpuruọchịchị ahụ.

Ọ kpọpụtakwara mpụtara ole otu ndọrọndọrọ ọbụla nwetere na ntụliaka nke e mere ụbọchị Satọdee, ma kwukwazie na a ga-agbakwụnye ya mpụtàrà nke e nwetere na ntụliaka nke ahụ e mere n'Ihiala, iji wee nwete mkpokọta ọnụọgụgụ vootu niile a tụrụ, nà nke otu ndọrọndọrọ ọbụla nwetere, ka e wee mara onye na otu ndọrọndọrọ tuuru ugo na nhọpụta ahụ.

Ka ọ gbakọchazịrị mpụtàrà ntụliaka niile ahụ, o kwuwara na ọ bụ Ọkammụta Soludo tùùrù ùgo, n'ihi na ọ bụ ya nwetara ọnụọgụgụ vootu kachasị n'ime vootu otu ndọrọndọrọ iri na asatọ sonyéré na ntụliaka ahụ nwètàrà. Dịka o siri kpọpụta, mkpokọta ọnụọgụgụ niile ahụ otu ndọrọndọrọ dị icheiche nwetara 

Dịka o siri kpọpụta ya, mpụtara ikpeazụ na onụọgụgụ vootu otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla na onye ọbụla soro wee zọọ ọkwa ahụ nwetere na ntụliaka ahụ bụ:
 
1. Godwin Maduka (A) — 2,054
2. Ben Etiaba (AA) — 83
3. Chidozie Nwankwo (AAC) —588
4.  Akachukwu Nwankpo (ADC) — 324
5. Afam Ume-Ezeoke (ADP) — 773
6. Andy Uba (APC) — 43,285
7. Chukwuma Soludo (APGA)  — 112,229
8. Geoff Onyejegbu (APM) — 301
9. Azubuike Philip (APP) — 139
10. Okeke Chika Jerry (BP) — 186
11. Obiorah Agbasimelo (LP) — 2802
12. Leonard Emeka (NNPP) — 117
13. Ezenwafor Victor (NRM) — 213
14. Valentine Ozigbo (PDP) 53,807
15. Nnamdi Nwgbo (PRP) —437
16. Uzor Obinna Godwin (SDP) —842
17. Ifeanyi Ubah (YPP) 21,261
18. Okonkwo Obiorah Frances (ZLP) 2,082

O kwukwara na mkpokọta ọnụọgụgụ ndị debànyèrè aha maka ịtụ akwụkwọ n'Anambra dị 2466638, kwuo na ọnụọgụgụ ndị bịara ịtụ akwụkwọ dị 253,388, kwuo na ọnụọgụgụ vootu dị mma dị 241,523; kwuo na ọnụọgụgụ vootu ndị adịghị mma dị 8,108, ma kwukwazie na ọnụọgụgụ vootu niile a tụrụ na nhọpụta ahụ dị 249,631.

Mpụtara ahụ na-akọwakwa na otu ndọrọndọrọ APGA nwetere mmeri n'ime okpuruọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ, PDP nwete mmeri n'otu okpuruọchịchị, YPP nwetekwa mmeri n'otu okpuruọchịchị.

Lee ka o siri zoo ma gbachaa n'okpuruọchịchị dị icheiche:
(1) Dunukofia
APC 1991
APGA 4124
PDP 1680
YPP 1360

(2) Awka South  
APC 2595
APGA 12,891
PDP 5498
YPP 919

(3) Oyi LGA 
APC 2830
APGA 6133
PDP 2484
YPP 900

(4) Ayamelum 
APC 2409
APGA 3424
PDP 2804
YPP 407

(5) Anaocha 
APC 2085
APGA 6911
PDP 5108
YPP 868

(6) Anambra East 
APC 2034
APGA 9747
PDP 1380
YPP 559

(7) Idemili South 
APC 1039
APGA 2312
PDP 2016
YPP 752

(8) Onitsha South 
APC 2050
APGA 4281
PDP 2253
YPP 271

(9) Njikoka 
APC 3216
APGA 8803
PDP 3409
YPP 924

(10) Nnewi North 
APC 1278
APGA 3369
PDP 1511
YPP 6485

(11) Orumba South 
APC 2060
APGA 4394
PDP 1672
YPP 887

(12) Ogbaru 
APC 1178
APGA 3051
PDP 3445
YPP 484

(13) Onitsha North 
APC 3909
APGA 5587
PDP 3781
YPP 682

(14) Aguata 
APC 4773
APGA 9136
PDP 3798
YPP 1070

(15) Ihiala 
APC 343
APGA 8283
PDP 2485
YPP 344

(16) Idemili North 
APC 2291
APGA 5358
PDP 2312
YPP 902

(17)  Ekwusigo 
APC 1237
APGA 2570
PDP 1857
YPP 727

(18)  Nnewi South 
APC 1307
APGA 3243
PDP 2226
YPP 1327

(19) Orumba North 
APC - 2672
APGA - 4787
PDP - 1847
YPP- 655

(20) Awka North 
APC 755
APGA 1908
PDP 840
YPP 381

(21) Anambra West 
APC 1233
APGA 1918
PDP 1401
YPP 357

N'okwu ya banyere nhọpụta ahụ, onyeisi ụlọọrụ INEC na steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkwachukwu Orji kọwara nhọpụta ahụ dịka nke gara siriri-werere, n'ụzọ udo na n'ụzọ ghe anya oghe, ma kelekwazie Ndị Anambra na ndị otu dị icheiche nyere aka ịhụ na ya bụ nhọpụta ọchịchị gara nke ọma ma gakwa n'ụzọ udo, n'agbànyèghị ihe ọdachi na ihe egwu niile dapụtara na mbido nà oge a na-akwado ya bụ ntụliaka.

N'okwu ya oge ọ na-anabata mmeri ahụ, Ọkammụta Soludo, onye ọñụ jupụtara obi, kọwara na ọ bụ ọchịchọobi Chineke na ọ ga-enwete ya bụ mmeri, maka na ọ bụ Chukwu na-eme eze, ọbụladị dịka o kelekwara ụmụafọ steeti Anambra maka ezi ntụkwasịobi ha nwere na ya na n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA, wee nye ya nkwado dị ịtụnanya. Dịka ọ na-ekwu na ọ bụ ahọ iri na abụọ gara aga ka ndị Anambra malitere chọba ya ka o jeere ha ozi, bụzị nke Chineke mezịrị ka ọ pụta ihe ugbua, o kwekwazịrị nkwà na ọ gaghị agharịpụ ha, site n'inye aka Chineke na ezi nkwàdo ha.

O kelere aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, ndị ndu na ndịisi otu ndọrọndọrọ APGA, na ọtụtụ ndị ọzọ nyere aka ime ka nrọ ahụ pụta ìhè, ma kọwakwa nhọpụta ahụ, usoro na akụrụngwa BIVAS ahụ e jiri mee ya dịka nke magburu onwe ya, n'agbanyeghị na e nwegasịrị ihe iche aka mgba n'ụfọdụ ebe.

Ọ kpọkuzịrị Ndị Anambra ka ha jisie ike na-akwàdo aka na-achị steeti ahụ ugbua, bụ Gọvanọ Obianọ nà otu ndọrọndọrọ APGA, ka ya bụ ezi ọchịchị dị na steeti ahụ wee na-agawanye n'ihu. Oge ọ na-ekwe ha nkwà ezi njikọaka, ọ dụkwazịrị ndị ọzọ ya na ha zọrọ ọkwa ahụ ka ha nabata mmeri ahụ ma nyere ya aka n'ọrụ ibuli steeti ahụ n'ogoogo dị elu, maka na steeti ahụ bụ steeti ha niile.

Onyeisiala Muhammadu Buhari, Gọvanọ Willie Obianọ, gọvanọ Benue bụ Samuel Ortom na ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na ngalaba dị icheiche n'ala Nigeria na na mba ofesi ekeleela Ọkammụta Soludo maka nturuugo ya, site n'ozi dị icheiche ha kụpụrụ ụbọchị Wenezdee banyere nhọpụta ọchịchị ahụ.

Ọkammụta Soludo na osote ya, bụ́ Dọkita Onyekachukwu Ibezim, bụkwazị ndị a ga-edu n'iyi ọrụ iweghara ọkwa dịka gọvanọ na osote gọvanọ steeti Anambra n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ 2022, bụ oge agba ọchịchị nke abụọ nke Gọvanọ Obianọ ga-abịa na njedobe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484