Nhọpụta Ọchịchị Anambra: Soludo Bụ Onye Kacha Tozu Òkè Ịnọchi Anya M —Obianọ

Oct 11, 2021 - 21:26
 0
Nhọpụta Ọchịchị Anambra: Soludo Bụ Onye Kacha Tozu Òkè Ịnọchi Anya M —Obianọ


Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ adụọla ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha tụnyere onye ahụ ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance, (APGA)' were azọ ọkwa Gọvanọ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo, ka o wee nweta mmeri dara ụdà na nhọpụta ọkwa Gọvanọ ahụ a ga-eme na steeti ahụ n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a.

Gọvanọ Obianọ nyere ndụmọdụ a n'ọgbakọ pụrụ iche ya na ndị ndu òtù ndọrọndọrọ APGA nwere n'ebe obibi gọọmenti dị n'Amawbịa, bụkwa ebe ọ nọrọ wee kelee ndị otu ndọrọndọrọ ahụ maka nkwàdo dị icheiche ha nyegoro ya kemgbe o jiri bata n'ọkwa ọchịchị wee ruo taa.

O kwere nkwà na ọ ga-emezucha nkwà dị niile o kwere tupu oge ọchịchị ya abịa n'isi njedobe, ma gwakwazie ndị òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na ụmụafọ steeti ahụ na ọ dị óké mkpa na onye ọbụla tinyere aka n'ọrụ ma gbasie mbọ ike, iji hụ na APGA nwetere mmeri na nhọpụta ahụ a ga-eme na steeti ahụ, maka na ọchịchị APGA dị Anambra ahụ mma.

N'okwu nke ya, nwunye aka na-achị steeti ahụ, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ kwupụtara ntụkwasịobi o nwere n'ọchịchị APGA na steeti ahụ, ọkachasị n'ọrụ mmepe ya n'ime obodo dị icheiche; ọbụladị dịka ọ kọwara na ntụliaka ọnwa Nọvemba ahụ ga-abụ ntụliaka ga-ekpebi ọdịnihu steeti ahụ na ụmụafọ ya.

O kwuru na ọ bụ ihe dị ndịisi ọchịchị APGA mkpa nke ukwuu ma na-echukwa ha ụra, bụ iguzobe onye ga-anọchi anya Gọvanọ ahụ ma ọ chịchaa, rịtuo, iji malite ọrụ ọma ya ebe ya onwe ya kwụsịrị. O tinyekwazịrị olu wee dụọ ndị Anambra ọdụ, ka ha nye aka ịhụ na Ọkammụta Soludo nwetere mmeri na nhọpụta ahụ.

Na ntụnye nke ya, ya bụ onye ji aha APGA azọ ọkwa, bụ Ọkammụta Soludo gbara akaebe na APGA na-eme nke ọma n'ihe gbasaara mmepe obodo, n'ilekwasị anya n'ọchịchị ya (APGA) n'ime steeti ahụ ahọ olenaole gara aga.

O kwekwara nkwà na ọchịchị ya ga-ebido ebe ọchịchị Gọvanọ Obianọ rụdobere ọrụ, gbakwasa ụkwụ n'ezi ụkpụrụ ahụ Gọvanọ tọgòrò, ma rụkwàsá ọrụ n'elu ya, iji kwàlitekwuo ezi ọnọdụ mmepe tọrọ àtọ na steeti ahụ.

Ọgbakọ ahụ dọtara ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'otu ndọrọndọrọ APGA na, tinyere ndị ndu otu ndọrọndọrọ ahụ n'ime-ime obodo dị icheiche na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484