Nigeria ewubego iwu megide itu mgbere mmadu

Jan 17, 2013 - 06:00
Jan 22, 2021 - 07:23
 0
Nigeria ewubego iwu megide itu mgbere mmadu

Ndị omebe iwu nke ala Nigeria eweputego akwụkwọ iwu ọhụrụ, nke megidere itụ mgbere mmadụ. Ndị otu Nigerian Federal Executive Council enyego nnakwe ha, sị na onye ọ bụna e jidoro ebe ọ na-ada iwu ọhụrụ a megidere ire ma ọ bụ ịzụ mmadụ n’ụdị ọ bụna, ga-aga mkpọrọ afọ asaa.

Ka ndị otu a nwechara nzụkọ ha n’Abuja, n’ụbọchị Nwenezdee, onye minista na-ahụ maka mgbasa ozi, Mazị Labaran Maku, kwuru nke a na bekee:

the Attorney-General of the Federation and Minister of Justice, Mohammed Bello Adoke, tabled a memorandum before the Council to seek approval for the Trafficking in Persons (Prohibition), Enforcement and Administration Bill, 2012.”

Mazị Maku kwuru n’ala Nigeria nweburu iwu megidere ịtụ mgbere mmadụ, mana iwu a nwere ebe ole n’ole o riri mperi. Ihe a na-ame ugbu a bụ ime ka iwu a kwụdosie ike. Ha anabatago mkpọrọ afọ asaa maka onye ọ bụna dara iwu a.

Mazị Maku gbakwụnyere na a ga-enyefe akwụkwọ iwu a n’aka ndị ụlọ omebe iwu na nso a, maka ime ka ọ diwazie ire dịka iwu na-achị ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.