Nigeria na Zambia gbaziri onye lawa onye lawa

Jan 27, 2013 - 06:00
Jan 22, 2021 - 06:35
 0
Nigeria na Zambia gbaziri onye lawa onye lawa

Ndị otu egwu-bọọlụ ụkwụ nke ala Nigeria, Super Eagles, etufuona ohere ọzọ ha nwetere iji gosi na ha so na ndị bụ ndị n’asọmpi bọọlụ iko mba Afrịka nke na-aga n’ihu ugbu a.

Nigeria hapụrụ Zambia ha saa otu ọkpụ goolu Nigeria buru ụzọ nwete site n’aka Emmanuel Emenike. Tupu Emenike akụta otu goolu ahụ, Obi Mikel riri otu penaliti, nke karụ ịbụ goolu izizi nye ndị Nigeria.

Ndị egwu bọọlụ na-amasị na Nigeria, chere na Nigeria ga-ejisi ike merie ndị Zambia. Ọ bụ ihe anya-mmiri mgbe ndị Zambia mechara sata otu ọkpụ ahụ oge bọọlụ na-akwado ịbịa n’isi njedebe. Nigeria na Zambia gbaziri onye lawa onye lawa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.