NIMASA Ebunyela Gọọmentị Anambra Akụrụngwa Nkwàlite Mmụta

Jun 3, 2021 - 20:22
 0
NIMASA Ebunyela Gọọmentị Anambra Akụrụngwa Nkwàlite Mmụta

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ 'Nigerian Maritime Administration and Safety Agency (NIMASA) ebunyela ọchịchị steeti Anambra igwè kọmputa na akụrụngwa ndị ọzọ dị iche iche e ji akwàlite ọnọdụ mmụta, iji kwàdo ọnọdụ agụmakwụkwọ na steeti ahụ.

Ibunye akụrụngwa a bụ nke ndị ụlọọrụ a mere n'ụlọọrụ odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ steeti Anambra, dị n'obi gọọmenti steeti ahụ, bụ ebe ndị òtù ahụ nọrọ wee bunye gọọmentị igwè kọmputa ruru iri anọ n'ọnụọgụgụ, na ụfọdụ akụrụngwa mmụta ndị ọzọ.

Akụrụngwa ndị ọzọ ụlọọrụ ahụ bunyere gọọmentị Anambra gụnyèrè: bọọdụ ọcha e ji ede ihe, ihe nhicha bọọdụ, mkpịsị e ji ede ihe na bọọdụ, akwụkwọ e ji ede ihe, akwụkwọ arụmarụ, tinyere ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ ndị ọzọ dị iche iche na akụrụngwa ndị ọzọ, maka ụlọakwụkwọ praịma na sekọndịrị.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi ngalaba na-ahụ maka ego na nhazi ụlọọrụ NIMASA, bụ Maazị Chidi Offodile, mèrè ka a mara na ebumnobi ha jiri bute akụrụngwa ahụ bụ iji kwàdo gọọmentị na agụmakwụkwọ steeti ahụ n'okpuru atụmatụ 'Corporate Social Responsibility' ụlọọrụ ahụ na-eme, bụ nke ha na-esite na ya wee na-arụgasị ọrụ pụrụ iche na mgbe na mgbe na mpaghara ebe dị iche iche ha nọ, maka na ọ bụ ebe onye bi ka ọ na-awàchi.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ụlọọrụ NIMASA agaghị ada mbà inye aka n'ebe ọ dị mkpa na n'ụdị kwesiri ekwesi n'ịkwàlìtè ọnọdụ mmepe na ọnọdụ obibindụ ụmụafọ Nigeria, ọbụladị dịka ọ kpọkùzịrị ụlọakwụkwọ dị iche iche ga-enweta akụrụngwa kọmputa ahụ na ihe ndị ọzọ ahụ ka ha tinye ya n'ọrụ nke ọma dịka o siri kwesi ekwesi.

Na nzaghachi oge ọ na-anabàta akụrụngwa ahụ n'aha gọọmentị Anambra, odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu kelère NIMASA maka ezi nkwàdo na ezi ọrụ ahụ, ma bunyekwa ha ụkpa ekele n'ihi etu ha si eme ihe ahụ na mgbe na mgbe na steeti ahụ. 

O mere ka a mara na ụlọọrụ ahụ sokwa n'ụlọọrụ gbataara gọọmentị steeti ahụ ọsọ site n'ibunye ya ụfọdụ ihe nkwàdo dị iche iche n'oge ahụ ọrịa nje korona kachara wee mee mkpamkpa, wee rukwazie ugbua, ha bịakwa ịkwàdò agụmakwụkwọ steeti ahụ.

O kwere nkwà na gọọmentị na ụlọọrụ dị iche iche ga-enweta akụrụngwa ahụ ga-etinye ya n'ọrụ etu a tụrụ anya, gbaa akaebe na nke ahụ ga-enye aka n'ịkwàlite ọnọdụ mmụta steeti ahụ; ọbụladị ka o mere ka a mara na gọọmentị steeti ahụ na-atụ anya ma dịkwà njikere ịnabata ha na nkwàdo ha mgbe ọzọ.
 
N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma na steeti ahụ, bụ Maazị C-Don Adịnụba kwùrù na akụrụngwa ahụ ga-enye aka n'ime ka ọnọdụ agụmakwụkwọ steeti ahụ ka gbagokwuo n'ogoogo dị elu, mee ka ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ gaa n'ihu ịmụta ka e si eji usoro ígwè kọmputa na mgbasaozi ọgbara ọhụrụ, bụ ICT, were akwàlite mmụta ma na-emekwa ihe dị iche iche.

Ọ kọwara na aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ emeela ihe dara ụda n'ịkwàlite agụmakwụkwọ steeti ahụ, bụ nke mịtagoro ọtụtụ ezi mkpụrụ pụtara ìhè, ma kọwazie na akụrụngwa ahụ ndị NIMASA butere ga-enyekwu aka n'ịkwàdo ezi ọrụ ahụ gọvanọ na-arụ na ngalaba agụmakwụkwọ steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484