N'Imo, Ndị Ojiegbe Egbuola Onyeisi Ndị Uweojii, Dịka Ndị Uweojii Gbagburu Mmadụ Isii

Jul 27, 2021 - 21:10
Jul 27, 2021 - 21:13
 0
N'Imo, Ndị Ojiegbe Egbuola Onyeisi Ndị Uweojii, Dịka Ndị Uweojii Gbagburu Mmadụ Isii

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ojiegbe nọrọ na nsonso a wee gbuo otu onyeisi ndị uweojii, bụ onye ji ọkwa DPO na mpaghara Omuma dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Oru East' nke steeti Imo, bụ CSP Fatmann Doiyoor.

Ya bụ onyeisi ndị uweojii ka e kwuru na ndị omekome ahụ (ruru iri na asaa n'ọnụọgụgụ) gbàgbùrù oge ha na ndị uweojii nà-akwàrịta mgbọ, bụzị nke e sitere na ya wee gbagbuo mmadụ isii ndị omekome ahụ ma nwụchie mmadụ iri na otu ndị ọzọ n'ime ha.

Akụkọ kọrọ na ndị uweojii ahụ wakpòrò ndị omekome ahụ oge ha bu ụgbọala atọ na-esochi ibe ha wee na-aga n'okporoụzọ Omuma; ha wee bido ịkwà mgbọ

Onye ji ọkwa 'Area Commander' n mpaghara ọmụma ahụ, bụ ACP Benjamin Abang kwuru na ihe ahụ mere n'eziokwu, ma mekwa ka isi ọchịchị ndị uweojii na steeti Imo mara maka ya.

N'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Imo, bụ Maazị Michael Abattam mere ka a mara na ndị uweojii ahụ napụtàkwàrà ndị omekome ahụ ụgbọala atọ ahụ ha ji akpagharị, nke gụnyere 'Toyota Highlander SUV' abụọ (nwere akàrà 'Abia MBL 517 AT' na 'LAGOS , JJJ 984 EL' n'otu n'otu, ya na ụgbọala 'Lexus Jeep' enweghị akara, bụkwazị nke ha dọbara n'ụlọọrụ ha ugbua. O kwukwara na ha amalitela ime nnyòcha iji nwụchikọọ ndị nke ahụ gbara ọsọ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Abutu Yaro, fdc, nàrà ndị ọrụ ya aka maka ịlụ ọgụ dịka nwoke. O kpere ka mkpụrụobi CSP Doiyoor ndị omekome ahụ gbagburu zuru ike na ndokwa, ma kpọkuzie, dọọ ndị omekome aka na ntị, ka ha kwakọrọ ngwongwo ha si na steeti ahụ pụọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484