N'Imo, Ndi Omekoome Awakpola Ụlọọrụ Uweojii Na Ụlọnga, Tọhapụ Ndị Nga

Apr 8, 2021 - 10:22
 0
N'Imo, Ndi Omekoome Awakpola Ụlọọrụ Uweojii Na Ụlọnga, Tọhapụ Ndị Nga

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ihe égwù mere na steeti Imo na nsonso, dịka ndị ojiegbe na ndị omekoome a maghị ndị ha bụ wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Owerri bụ isi obodo steeti ahụ, na ụlọ mkpọrọ dịkwa n'ebe ahụ, wee gbarikọọ ebe niile, ma kpọghepu imirikiti ndị nga nọgasị ebe ahụ ka ha laa na be ha.

Akụkọ kọrọ na ndị omekoome ahụ jí ọtụtụ ngwọgụ na ogbunigwè, bùrù ụzọ gụọ egwu, ma gbaa ọtụtụ egbe ruo ihe dịka awa atọ, tupu ha wakpo ebe ahụ, ma gbakwa ya ọkụ. Onye ọnọmgbeomere na-ekwukwa na ha bụ ndị omekoome jiri ogbunigwè wee gbagwòó ụlọọrụ ụfọdụ ndị na-arụ n'ụlọnga ahụ tupu ha wee meghepuzie ndị ahụ a tụrụ nga ebe ahụ.

N'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'isi ụlọọrụ uweojii ala Nigeria, bụ CP Frank Mba gbàrà akaebe na o nweghị onye uweojii ọbụla tụfuru ndụ ya n'ihi mwakpò ahụ, kama na ọ bụ naanị otu onye uweojii nwetara mmerụahụ n'ebe ahụ, n'ihi mgbọ tụrụ ya.

O kwuru na ọ bụ ndị òtù 'Indigenous People of Biafra (IPOB)' na òtù ọrụ nchekwa ha bụ 'Eastern Security Network (ESN)' kpara mkpamkpa abụọ ahụ ụbọchị ahụ, ma mee ka a mara na ọnụọgụgụ ndị nga ha kpọghepuru ụbọchị ahụ dị otu puku na narị asatọ na iri asatọ na anọ (1884), ebe ụgbọala ha gbara ọkụ ụbọchị ahụ ruru iri ise (50) n'ọnụọgụgụ.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ha bụ ndị uweojii enwetela otu n'ime ụgbọala ndị omekoome ahụ jiri wee bịa ya bụ ọrụ mbíbì, ma kọwaa na onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria enyela ntuziaka ka a nwụchikọọ ndị òtù IPOB na ESN na steeti ahụ.

Mwakpo nke abụọ...

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibè ya, ka ọ gachaara ihe erughị awa iri anọ na asatọ ihe ahụ jiri mechaa ụbọchị Monde, ndị omekoomè ahụ wakpòkwàrà isi ụlọọrụ ndị uweojii ọzọ dịkwa na steeti Imo ahụ (n'okpuru ọchịchị ime obodo Ehime Mbanọ), wee kpakwa mkpamkpa dị egwù n'ebe ahụ.

Mwakpo nke ugboro abụọ a ka e mere ka a mara na ndị omekoome ahụ mere ya ka ọ gachara nkeji olenaole onyeisi uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Muhammed Adamu, osote onyeisiala, bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo na ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n'ọrụ gọọmentị gachara njem nleta n'ebe ahụ mkpamkpa nke mbụ kpara ụbọchị Mọnde.

Dịka akụkọ siri kọọ, ndị omekoome ahụ rụrụ ọrụ ahụ ihe ruru nkeji iri anọ na ise, n'enweghị onye ọbụla sịrị ha 'hoa!' ma ya fọdụzie ịgba ha egbè, tupu ha mechaa ihe ha mere ebe ahụ, kụwasịa ebe dị iche iche a kpọchiri ndị mmadụ n'ebe ahụ, kpọghepụsie ndị nọ n'ime ya, ma mụnyekwazie ụlọọrụ uweojii ahụ na ụgbọala atọ ọkụ, wee féé ka nnụnụ ozigbo, larie.

Ka ọ dị ugbua ndị uweojii steeti ahụ ekechisiela ọgọdọ ha ike maka iweghachi ezi ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ, ọbụladị dịka ha na-ekezị mkwụchà iji hụ na ụdị ajọ ọdachi ahụ adapụtaghịzị ọzọ na steeti ahụ, ma na-agbasikwa mbọ ịnwụchikọ ndị niile aka ha dị na mwakpo ahụ.

Minista na-ahụ maka ihe metụtara
ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ Maigari Dingyadi jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo ndị mkpọrọ ahụ a tọhapụsịrị n'ụlọ mkpọrọ ụbọchị ahụ, ka ha were ọsọ chighatasịa azụ ka a kpọchikwa ha ọzọ, n'ihi na ha enweghị ebe nzuzo ọbụla, nke na a ka ga-anwụchikọkwa ha ma ọ bụrụ na ha alighachighị azụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484