Njirimara Na Omenala Igbo: Akwamozu n'Ala Igbo

Sep 22, 2017 - 19:59
Jan 22, 2021 - 03:55
 0
Njirimara Na Omenala Igbo: Akwamozu n'Ala Igbo
Igbo Radio News

Izunna Okafor, Awka

Akwamozu bụ e mee nwata ka e mere ibe ya. Ọ bụ otu n'ime emume zuru ụwa ọnụ ma bụrụkwa mmemme zuru ọnwa na ahọ ọnụ maka na ụwa bụ ahịa na-azụ kwa ụbọchị; ndị na-eje eje ndị a na-ala ala.

', '

Akwamozu bụ e mee nwata ka e mere ibe ya. Ọ bụ otu n'ime emume zuru ụwa ọnụ ma bụrụkwa mmemme zuru ọnwa na ahọ ọnụ maka na ụwa bụ ahịa na-azụ kwa ụbọchị; ndị na-eje eje ndị a na-ala ala.

Akwamozu bụ ugwu ikpeazụ a na-akwanyere onye nwụrụ anwụ na emume ikpeazụ a na-emere ya iji sị ya gaa ije ya nke ọma. Nke a bụ n'ihi na ọ bịara ije ga-alarịrị ala, ụdị ogologo ọ sọkwara ije ya too, maka na o nweghị onye ga-epu ome n'ụwa a.

Ndị ọbụla, ọbụnadị ndị Awụsa na ndị ọcha na-emegbado emume akwamozu maka na a nwụọ elighị elu na-ebute a nwụma ebighị ebi. Ọ bụ eziokwu na ndị ọbụla na agbụrụ dị iche iche nwere otu ha si eme nke ha, mana otu ọbụla e sina mee ya, ihe na-adịghị mgbagha bụ na a kwaana ozu.

N'ala Igbo, a hụtara akwamozu dịka mmemme ọ bụ m ka ọ bụ gị maka na ebe onye na -akwa mmadụ ka ọ na-akwa onwe ya. Oku ọnwụ bụ mgbe chi onye ụwa jiri kpọọ ya maka na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya ọ laa. Onweghịkwa onye maara oge nke ya ga-abụ, ọbụnadị ndị che na ha na-ahụ ụzọ apụghị ịhụ nke ahụ maka na ihe Chukwu zonahịrị Mmụọ ozi, ọbụzị mmadụ pụrụ ịmata ya?? Ọ bụ nke a mere na ndị Igbo ejighị akwamozu egwu egwu, ọ kachasị n'oge mbụ.

N'oge mbụ ahụ, ọ bụrụ na mmadụ nwụọ ma ọ bụ ọ nwekwahaa ka e siri tie mkpu akwa o wee bụrụ mkpu ọnwụ, ntị ọbụla nụrụ ya, ọbụnadị onye ntị ochi, ga-ebihapụ ihe ọbụla ọ na-eme ma agbara gaba ebe ahụ ozigbo ịga mara ihe na-akpọtụ.

E ruo ebe ahụ, ọ bụrụ na isi dara n'ezie, onye ọbụla ọ kachasị ụmụnwaanyị na-atawara akwa na-ebe iji besuo ozu ahụ. Ụfọdụ n'ime ha ndị enweghị obi na-ebekarịkwuzị ndị ọ bụ mmadụ nwụnahịrị, ọ kachasị ọ bụrụ ezigbo mmadụ, mmadụ ọha, ma ọ bụ isi a hụrụ kwaba okpu n'ezinaụlọ ahụ nwụrụ.

Mgbe nke ahụ gachara, ụmụ okorobịa na-amalite gwube ili ozigbo ozigbo maka olili ya n'ihi na o nweghị ihe dịka ụlọ nchekwa ozu n'oge ahụ. A sịkwa na ozu e lighị eli nọ ọdụ ka nsị e kpoghị ekpo, maka na awọ koo, a nụ isi ya.

E lichaa ozu, ọ bụrụ na ọ bụ nke apụghị ịkwa oge ahụ n'ihi otu ihe ma ọ bụ nke ọzọ; a ga-akanye ụbọchị a ga-akwa ya, ma zisasịara ndị nke ahụ metụtara ozi ka ha wee kwadobe, maka na ọ bụ mmadụ ka e ji aka.

Tupu ụbọchị akwamozu ahụ kpọnkwem, ndị inyom, bụ ụmụ nwaanyị a lụtara n'ogbe ahụ ma ọ bụ na okirikiri ahụ na-akpata ukwu nkụ n'otu n'otu ma chuta mmiri buje n'ezinaụlọ ahụ dịka enyemaka nke ha nyegara ndị ahụ na ntụnye nke ha iji hụ na ya bụ akwamozu gara nke ọma. Ha na-agakwa rụchaa ma zachasịa mbara ebe ahụ niile, ọ na-eti korikori, maka na ihe dị mma na anya gbara, ọbụnadị n'ebe e nwere ihe dị njọ. Ụmụnwoke na-agakwa gbuo achara na igu, maa ọwọkọ, ma gbochisiekwa ebe e kwesiri ile mgbochi n'iji kwadobe ya bụ ebe. N'echi ya bụ ụbọchị mmemme kpọnkwem, onye ọbụla nọ n'obodo ahụ torugoro ihe e ji mmadụ eme na apụta n'uju ma sonye na ya bụ mmemme anya mmiri, ma' ọnọ n'ụlọ ma ọnọ n'ọhịa' (ndị bi n'obodo ahụ na ndị bi n'ebe dị iche iche). Nke a bụ n'ihi na ebe onye na-akwa mmadụ ka ọ na-akwa onwe ya. Gidigidi bụ ugwu eze, maka na ọ zụọ gidigidi a hụ ọha, a mara na obodo nwere mmadụ.

Nke ahụ wee bụrụ otu e si akwa ozu n'oge mbụ, bụ mgbe elu bụ ala ọsa, oge e ji mmadụ akpọrọ ihe karịa akụ, oge a na-emere ndị na-akwa ozu ebere, nakwa oge ndị na-akwa ozu na-emekwara onwe ha ebere.

Mana oge ugbu a, ihe ndị a adịghịzịkwa otu ha dị na mbụ maka na amamihe kọzịrị ụkọ n'akpa onye amamihe, ebe uche zuru oke funahịgokwara onye akpa uche. Ihe niile wee na-adazị hakoro hakoro maka na onye ghara ụzọ si ọhịa, ya na osisi ọhịa ana-alụ. Isi ghara èdè kụọ mkpi, ọgịga abụrụ ọgụ na mgba.

Ugbu a bụzị oge mmadụ ga anwụọ, kama a ga-eli ya, eburu ya ga dọbagodi n'ụlọ nchekwa ozu, ka a ga-asị na ọbụghịzị akwa ala ga-ata ya, ma ọ bụ na ọ bụghị n'ala ka a ga-eli ya. Nke ahụ ga-anọzịkwa ebe ahụ wee mụọ ọtụtụ ego, tinyere ego ndị ọzọ a na-emefuzị n'akwamozu ugbu a.

Ugbu a bụzịkwa oge mmadụ na-aga ree ala, ree ngwongwo ya, ma ọ bụ mee ihe ndị ọzọ dị iche iche ka o wee nweta ego ọ ga-eji kwa ozu, maka na ndị mmadụ na-amazịkwa aka onye akwamozu ya ga-aka da ụda, ma ọ bụ wee kwo ekwo. Ọ dịzie ka a ga-asị na a na-agba asara ma ọ bụ na a na-eme mmemme okpensi. Nke a wee bụrụ n'ihi na ọ gbara anyị bụ ndị Igbo nchezọ, bụ ihe akwamozu pụtara.

Ugbu a, ọtụtụ ndị nwere ndị ọrịa na ndị ogbenye dị iche iche n'ụlọ na-agbachị ha nkịtị, ha ana-anwụ ma ọ bụ weere isi na-eje ije, biri n'ụlọ akịrịka, agụọ ana-echikwa ha ọnụ n'ala. Onweghị onye ọbụla ga-ajụ ha ka a na-anwụ anwụ ka a na-ete ete, ma ndị ụlọ ma ndị ama. Mana ngwa ngwa onye ahụ mere kpọgem n'ala, ọ bụrụ ọnwụ; ịhụ ka ndị be ya ga-amalite ịnyụsị ego ka nsị. Ha ga-ebugodi ụzọ kụtuo ụlọ ọkpọkịrị aja ya ahụ ma rụọ agidigba ụlọ elu ọhụụ ebe ahụ. Ha ga-ekpochasịkwa ebe ọbụla ma were ego tie ya ịgba, dịka a ga-asị na anya onye ahụ adịghị mma ịhụ ụlọ elu na ndụ ya.

Ụfọdụ na-aga gokwara onye ahụ akpati kacha wee gala ọnụ n'ahịa, dịka a ga-asị na ili bụ ebe obibi, ma ọ bụ na ego na-aka mma ha oriri n'ọnwụ. Ụfọdụ ndị ọzọ na-agakwa biri ego n'ihu arụsị ka ha wee mee ka akwamozu onye nke ha dakarịa n'ụda, ebe ụfọdụ na-erisisi ihe a gara eji zụpụta ndị dị ndụ, were kwaa onye nwụrụ anwụ.

Ọbụnadị ndị ụka, ndị obodo, ụmụ ọkpụ na otu dị iche iche na-achọzịkwa ka ha were ụtụ regbuo onye na-akwa ozu, nke pụta nnọọ e jiri sị na ala adịghị mma bụ uru ndị nze. Nke a gosiri n'ebe o doro anya na ndị ụka na ndị otu dị iche iche socha agbanye mmadụ anya n'oke mmefusi ego n'akwamozu site n'ụtụ afọ eju akpa ego. Obi ebere adịghịzịkwa, maka na ha ga-eji ụtụ wee tichakọchaa onye na-akwa ozu ego dị ya n'aka, ma gwakwa ya ụdị nri na mmanya ọ ga-esi debere ha.

Ndị obodo n'onwe ha enweghịzịkwa obi enyemaka ma ya fọdụzie ime ihe ọbụla nyegara onye na-akwa ozu, karịa ma ịbịa añụsịrị ya mmanya na irisiri ya nri o ji akwọ ndị ọgọ.

Ndi be anyị ọ bụzị gịnị na-eme??

Ọ bụzị a na-ekwu na ụlọ na-agba ọkụ, anyị ana-awụnyekuru ya abịrịbọ?? Ụfọdụ ndị bi ebe dị iche iche nụ na mmadụ nwụrụ n'obodo, ha agaghịdị akpọ n'ekwentị ma ọ bụ zie ozi, ma ya fọdụzịe ịbata ụlọ maka akwamozu ya. Ha asị na ihe siri ike, dịka a ga-asị na ha onwe ha agaghị anwụzị anwụ, ma ọ bụ na ọ bụghị mmadụ ga-eli ya.

Ndị Igbo be anyị, ka anyị werenụ uche na-ata akara maka na ihe e mere na-ejighị uche na-aghọ nzuzu n'anya onye akpa uche. Ya mere, ka anyị burugodinụ ụzọ ghọta na akwamozu abụghị ịgba asara ma ọ bụ ime okpensi, nke o ji abụ mmemme Ekeresileesi. Kama, ọ bụ ihe anya mmiri na ihe iru uju.

Ka anyị kwụsị ịgbakọ ego na mkpọ chere mgbe mmadụ nwụọrọ ka anyị wee nyere ya aka, ma ọ bụ ịgbakụta mmadụ, onye ogbenye, onye ọrịa na ihe ndị ọzọ a ga-eme eme azụ rukwaa mgbe onye ahụ dara n'ụra ọnwụ, anyi e wee malite ịnyụlasị ego elu ka nsị, ịrụ ụlọ elu na ime ihe ndị ọzọ, iji sị na anyị kwara onye ahụ n'ụzọ dara ụda. Akpati abụghị ebe obibi.

Ihe ndị a niile ga-enyere anyị aka ịhụ na anyị mere ihe ndị anyị kwesiri ime mgbe isi ka na-eku ume, ma nyekwa aka belata oke nghafu ego anyị na-emefusi n'akwamozu na n'isi onye nwụrụ anwụ. Ndị ụka n'aka nke ha kwesikwara iji ire ha gụọ eze ha ọnụ ma selata aka n'ụtụ na ihe oriri dị iche iche ha na-ana n'aka ndị na-akwa ozu tupu ha abịa ya bụ akwamozu, ka ihe wee hara ha na nso. Ka m gharakwa ịsị na ọ bụghịkwanụ ụka ịkwa mmadụ na-ebuga onye ahụ elu igwe. Mana ihe a gba n'aka, e jighị enyo elele ya.

Ya bụ, ndị be anyị, ka onye ọbụla haa nke o kwesiri ịha ma mee nke o kwesiri ime iji hụ na akwamozuṅgara nke ọma, na-abụghịkwa nke mmefusi ego. Maka na a dịghị ala ụma agbasa mmiri n'okwute. Onye a gwara kwe, ahụ ọzọ, a gwakwa ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.