Nke bụ Eziokwu Banyere Atụmatụ Nlekọta Ahụike Zuru Ụwa Ọnụ

Dec 30, 2021 - 07:22
 1
Nke bụ Eziokwu Banyere Atụmatụ Nlekọta Ahụike Zuru Ụwa Ọnụ

Nke bụ Eziokwu Banyere Atụmatụ Nlekọta Ahụike Zuru Ụwa Ọnụ (The Reality of the Universal Health Coverage, UHC)

.

Si n'aka Ngozi Perpetua Osuchukwu, PhD

.

Ụwa gbáá gburugburu nà-èmérùbe emume ncheta ụbọchị nlekọta ahụike zuru ụwa ọnụ (International Health Coverage Day) n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Disemba afọ ọbụla.

Ya bụ ụbọchị nà-échètara anyị ihe ndị dịgasị óké mkpa na ndụ mmadụ, nke gụnyere ezi ọnọdụ ahụike. Ọbụladị atụmatụ nke atọ nke òtù mba 'United Nations' maka afọ 2030, nke a maara dịka “United Nations 2030 Agenda, Sustainable Development Goals (SDG) 3” na-ekwu maka “Idịmma na Ezi Ọnọdụ Ahụike” (Wellness and Good Health). Ebumnobi nke a bụ iji hụ na onye ọbụla nwèrè ikike na ohere inweta ezi nlekọta ahụike oge ọbụla na n'ebe ọbụla. Kaosiladị, ọnọdụ á na-ahụ anya, ọkachasị n'obodo ndị ka na-emepe emepe, nà-ègósi na ọnọdụ ahụike amachaghị kwụrụ, nà inweta ọgwụgwọ dị̀ óké ọnụ ahịa, nà akụrụngwa nlekọta ahụike ézùchàghị òkè, nà atụmatụ nchekwa ahụike (a mààrà dịka “health insurance”) nọ̀kwà n'ogoogo dị ala nke ukwuu.

Ọrịa COVID-19 nà ụdị ya ahụ pụtara ọhụrụ a mààrà dịka 'Omicron' nà-ègósi, n'ebe o doro anya, obodo ndị ji ọnọdụ ahụike na ọdịmma ụmụafọ ha kpọ́rọ́ ihe nke ukwuu. N'agbànyèghị̀ na ụlọọrụ ahụike dí icheiche n'ala anyị na n'ogoogo mba ụwa agbaala mbọ n'ụdị dị icheiche n'ịgbásà ozi na inye nkụzi banyere ọnọdụ ahụike; á kà nwèkwàrà nnukwu ihe dị iche na oghere, nke na-arịọ ka e mechie ya, ka ndị bi n'obodo ka na-emepe emepe biri n'ebe ahụ nke ọma. Ọ na-agbawa obi ịtụle etu obodo ndị mepere emepe si enye ụmụafọ ha ọgwụgwọ ngwangwa nà etu obodo ndị ka na-emepe emepe si eme nke ha. Ị tụlee ihe a nke ọma, ị ga-ahụta na ọ dịzị̀ ka a ga-asị na o nwèrè n'obodo ebe ndụ mmadụ kacha bàá úrù nàkwà ebe a kacha akwanyere ndụ mmadụ ùgwù karịa n'obodo ndị ọzọ. Ọ́ bụrụ na nke a bụ eziokwu, kedụzị ebe okwu ahụ a kpụ n'ọnụ oge niile, bụ Nlekọta Ahụike Zuru Ụwa Ọnụ (Universal Health Coverage, UHC) dị?

Anyị na-anụ akụkọ banyere ndị mmadụ nwegasịrị ụdị ọrịa ime ahụ na ọrịa ọkpụtọrọkpụ dị icheiche, ndị apụghị inweta ezi nlekọta ahụike, n'ihi na ha enweghị ego ya.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị dị ime dárá ogbenye anwụọla n'ihi ihe mgbu na ihe ọdachi ndị ọzọ sitere n'ịnọ n'ụlọ be ha àmụ́ nwa, maka na ha enweghị ego ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ maọbụ ịga n'ụlọọgwụ maka nleruanya tupu ụbọchị ọmụmụnwa ha eruo. Ọtụtụ ụmụaka agbaghị ọgwụ kwesiri ha ịgba, nke mezịrị ka ha nọrọ n'ihe égwù ibute ụdị ọrịa dị icheiche na-efe èfè, bụ nke a kààrà igbochiri ha ma ọ bụrụ na ha gbara ọgwụ kwesiri ekwesi. Ụfọdụ ndị mmadụ ebidola ijizị aka ha enye onwe ha ọgwụgwọ na igo ọgwụ ngwakọrịta, iji buso ọrịa dị óké égwù agha. Ọbụladị ụfọdụ ndị nke kabara ahụ gaa ụlọọgwụ, maọbụ ndị nke a manyere amanye wee buru ha ọsọọsọ gaa ụlọọgwụ mgbe ha nọ n'ajọ ọnọdụ ahụike dị añaa, ha enweghị ike ịkwụnwu ụgwọ ụlọọgwụ ha. Nke a mèrè na a nà-ejidezị ha ọtụtụ mgbe n'ụlọọgwụ ahụ ma mekwa ka ha na-arahụ n'ala nkịtị, wee ruo mgbe kwụchara ụgwọ niile ha ji. Kedụzị ebe Atụmatụ Nlekọta Ahụike Zuru Ụwa Ọnụ dị? Ọtụtụ mgbe, a na-ahụkwa ebe ndị ụlọ nchekwa ozu na-ejide ozu mmadụ ma kwechiri na ndị be ha agaghị ebu ya laa, wee ruo mgbe ha kwụchara ụgwọ ụlọọgwụ ya ji tupu ọ nwụọ.

Ọ bụ n'akwụkwọ iduazị a kpọrọ “Animal Farm” nke George Orwell dere, ka okwu a bụ “Anụ niile hà, mana e nwere ndị kacha hàrá karịa íbè ha” siri wee màlite. Nke a ọ̀ gbásòrò maọbu daba adabà n'ebumnobi Atụmatụ Nlekọta Ahụike Zuru Ụwa Ọnụ? Kedu onye na-emete ya, kedukwa onye anaghị emete ya? Echiche gị na echiche m nwere ike bụrụ otu. Anyị na-anụ maka amụmà nchekwa ahụike (health insurance) nà uru dị icheiche ọ bààrà mmadụ. Mana, mmadụ òlé mà banyere ya? Mmadụ ole na-esonyekwa na ya n'eziokwu? Ụmụnwaanyị, ụmụnwoke na ụmụaka bi n'ime-ime obodo ọ nà-esonye na ya? Ọ̀ bụ̀ maka naanị ndị ọnụ na-eru n'okwu, ndị nwere ego, na ndị ọrụ oyibo ka e mebèèrè ya. Gịnị mere o jiri dị ka à gà-àsị́ na inweta ọgwụgwọ na ezi ọnọdụ ahụike dị̀ oke ọnụ ahịa ma hịakwa ahụ nnweta maka ọtụtụ mmadụ? Ọ́ bụ ihe kwere omume, ime ka ezi nlekọta ahụike bụrụ maka onye ọbụla na òtù ọbụla ma na-erukwa onye ọbụla aka oge niile.

Atụmatụ Nlekọta Ahụike Zúrú Ụwa Ọnụ (Universal Health Coverage, UHC) na-akpọku gọọmenti na obodo ọbụla ka ha mee ka mmadụ ọbụla nwee ike inweta ọgwụgwọ na ezi nlekọta ahụike n'enweghị mgbakàsị́ahụ maọbụ ihe mgbochi ọbụla. Ihe ọbụla kwèrè òmúmé ma ọ bụrụ na e nwee ezi obi, ezi ọchịchị nà ọmarịcha usoro na-arụ ọrụ nke ọma. Ọzọ, ndị mmadụ na òtù dị icheiche abụrụla ndị a mà àmá ná-ényé aka n'ịzọpụ ụkwụ, ịkpọtụrụ maọbụ n'ịkpọ òkù maka ezi ọnọdụ ahụike nà inye nkwàdó maka ya.

Ndị be anyị chọrọ ezi nlekọta ahụike oge niile na n'ebe niile. A pụ̀rụ̀ ịgbanwè ọnọdụ a, ma ọ bụrụ na e jikọta akụnụba ọnụ n'eziokwu. O nweghị onye e kwesiri ịgbakụta azụ n'ihe gbasara ezi ọnọdụ ahụike. Biko, kà ndị ọrụ lekọta ndị ha na-achị nke ọma. Ka ndị ọrụ ọma na ọrụ obiebere nà-àsọ́ ụsọ nà ndị nwere obiọma gaa n'ihu ikepụta ụdị ụwa anyị chọrọ, site n'ikwàlitè ihe metụtara ezi ọnọdụ ahụike.

Tụ̀nyé ụtụ nke gị ma rụọ ọrụ nke kwesiri gị, iji mee ka e nwee ezi Nlekọta Ahụike Zuru Ụwa Ọnụ n'ezie.

MAKA ONYE DERE EDEMEDE A:

Ngozi Perpetua Osuchukwu bụ onye ọrụ ọba akwụkwọ Nigeria nwere asambodo (Certified Librarian of Nigeria, CLN), ma nwekwa nzèré PhD n'ihe ọmụmụ maka Ọba Akwụkwọ (bụ Library and Information Science). Ọ bụ onyenkuzi mahadum nà onye na-arụ ọrụ iwètà mmepe. Ọ bụ onye nkwàdó na onye na-atụnye ụtụ nke ukwuu ma nwekwa mmasị pụrụ iche n'ihe gbasaara ịgbasà ozi n'ime obodo, ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma, na ime ka ha sonyesie ike n'ihe gbasaara ahụike. Ọ bụkwa onye na-akwàlite ikpe nkwụmọtọ nà usoro 'e mee nwata ka e mere íbè ya'.

Dkt. Osuchukwu enyela nkuzi ma bipụta edemede n'ọtụtụ isiokwu nà n'ọtụtụ ebe dị icheiche. O nwekwara mmasị pụrụ iche n'ihe gbasaara ịgbásà ozi na ime ka ndị mmadụ mara ihe ha kwesiri ịma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484