Nnọkwa Eriela Ji Ọhụrụ

Aug 28, 2021 - 20:57
 0
Nnọkwa Eriela Ji Ọhụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

O kwòrò èkwò ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Nnokwa, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili South' nke steeti Anambra merùbèrè mmemme iri ji ọhụrụ nke obodo ahụ, nke ahọ a bụ 2021.

Oke mmemme ahụ wèèrè ọnọdụ n'obi eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Emmanuel Ajamma dọtara ụmụafọ obodo ahụ, ma ọnọnụlọ ma ọnọnụzọije, ndị nwadiala Nnokwa, ndị ọgọ, ndị ikwu na ibè na ndị na-echere obodo ahọ ezi echiche, tinyere ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù, bụ ndị sitere ebe dị iche iche na gburugburu steeti ahụ na mpụga ya wee bịa.

Ka ọ na-eme omenala ịwa ji kpọnkwem na mmemme ahụ, Igwe Ajamma, onye wara ji ahụ ibe atọ kwupụtara obi ụtọ ya maka etu ọrụ ugbo ahọ a siri gaa na Nnọkwa, nakwà etu Chineke siri chekwaba ma debe ha ndụ, ha wee kọọ ma gwute n'ụba. 

Dịka ọ na-eme ka a mara na Nnọkwa so n'otu n'ime obodo si na Nri bụ isi ala Igbo wee pụta, ọ kọwara na iri ji ọhụrụ bụ emume ndị Igbo ji akwanyere ji ùgwù pụrụ iche  dịka eze ihe a kọrọ n'ubi, ma kọwakwa mkpà ọ dị ijigide na ịkwàlitesi omenala Igbo ike.

Ya bụ eze ọdịnala dụrụ ụmụ na-eto eto ọdụ ka ha na-esonyesi ike n'ọrụ ugbo, karịa ịdị na-arụ́chara ya arụchara, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche dị na ya, nke gụnyere inye ego, ime ka nri dị gbaanyụụ, na ime ka ndị ntorobịa nwee ọrụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ. Ọ gọkwazịrị ọfọ ogologo ndụ, ọganihu na ahụike n'isi ụmụafọ obodo ahụ, n'ebe ọbụla ha nọ; ma kpekwazie ka Chineke chekwaba ma gọzie ha mmaji kwuru mmaji ọbụladị dịka o kelekwara ndị dị iche iche bịara sonye na mmemme ahụ.

N'okwu nke ya, onyeisi ọchịchị obodo Nnọkwa, bụ Ọkaiwu Emeka Maduabuchi kpọkuru ma dụọ ndị ntorobịa ọdụ ka ha na-etinye anya n'ọrụ ugbo, na ihe ndị ọzọ ziri ezi ga-abara ha urù, ma sepụkwa aka n'ihe ọbụla bụ ihe ọjọọ, maka na o nweghị uru ọbụla dị na nke ahụ, ma ọ bụghị naanị ọnwụ ike maọbụ ihe ichu aha dị iche iche na-esi na ya apụta.

Ya bụ onyeisi ọchịchị Nnokwa Progress Union jikwàzịrị ohere ahụ wee rụtụgasịa aka n'ihe dị iche iche ya na ndị òtù ya mepụtagoro n'ọchịchị ha, kpọpụtasịakwa ihe dị iche iche ọchịchị steeti Anambra mepụtgoro n'obodo ahụ, ọbụladị dịka o gosipụtara obi ụtọ ya banyere etu ọrụ si agawanye n'ihu n'ụlọ ezumezu obodo ahụ, bụ 'Nnokwa Civic Centre'.

N'okwu nke ya, otu onye a mà àmá na-akwàlite atụmatụ Ugbo Azụ Ụnọ, ma bụrụkwa onye ji ọkwa dịka 'Director of Protocols' n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụ Maazị Charles Mbakigwe kpọpụtasịrị ihe usoro dị iche iche a na-agabiga were akọ ji, ma kọwakwazie ihe ndị Igbo ji akwanyere ji ùgwù pụrụ iche.

Eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Ajamma, onye ndị ichie ya gbara okirikiri, jìrì mmà wee waa ji ahụ ibe atọ, nke nọchitere anya mpaghara atọ dị na Nnokwa, nke gụnyere mpaghara Nnakụ, Etiti na Ifite. Ka nke ahụ gachara, a kpọpụtasịzịkwara ụmụnwoke atọ kacha bụrụ okenye n'ime mpaghara atọ ahụ, ha wee bịa weregasịa òkè ibe ji nke ha, n'aha ndị mpaghara ha, bụkwazị nke ha ga-eji (dịka ihe nri) wee lakwuru ndị mpaghara ha dị iche iche, ka ógbè dịgasị na mpaghara ahụ wee tinye ya na nri nke ha wee màlite iri ji ọhụrụ nke ha, dịka omenala obodo ahụ siri dị.
 
Ka nke ahụ gachazịrị, Igwe Ajamma na nwunye ya na ndị ichie ya pụtazịrị n'ọgbọ, wee gbaa egwu uhie, bụkwa nke mgbe e mechara ya, a màlitezie ikesà na iri ji a hụrụ ahụ e jiri ụkpaka na akwụkwọ ụtazị mara abụbà wee chọọ mma

A nọkwara ebe ahụ gbaa egwu mmanwụ na egwu ọdịnala dị iche iche site n'aka ndị ntorobịa na òtù ụmụnwaanyị.
 
Ọ bụ n'obi ụmụnna iri abụọ na ise e nwere na Nnọkwa ka a nọzị̀rị̀ wee mee nke bụ oriri na ọñụñụ n'ùjú, bụkwazị nke e mere n'otu oge na mpaghara niile nke obodo ahụ, onye ọbụla wee jiri ọñụ laa be ya, wee chebirikwa ma na-akwado onwe ya maka erimji ọhụrụ nke ahọ na-abịa abịa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484