Nnukwu Ụgbọala Bu Mmanụ Ọkụ Adaala n'Anambra

Aug 3, 2021 - 21:33
 0
Nnukwu Ụgbọala Bu Mmanụ Ọkụ Adaala n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a


Otu onye ọkwọ ụgbọala enwetela nnukwu mmerụahụ, dịka otu nnukwu ụgbọala bu mmanụ ọkụ dàrà na steeti Anambra.

Nnukwu ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke dapụtara na mpaghara njikọụzọ Abba, nke ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha, ma bụrụkwa nke dapụtara oge nnukwu ụgbọala ahụ bu mmanụ ọkụ jiri ọsọ wee suo ihe a rụnyere n'okporoụzọ a maara dịka “Access Road Island” na bekee. 

Akụkọ kọrọ na ụgbọala ahụ tụgharịrị n'ala ọtụtụ oge ugboro oge ọ dara, nke mezịrị ka mmanụ ọkụ o bu wụfusie n'ala n'okporoụzọ ahụ niile. Otu onye n'ime ndị ọkwọ ụgbọala nọ n'ime ụgbọala ahụ oge ahụ nwetekwazịrị nnukwu mmerụahụ, nke na ọ nọ n'ajọ ọnọdụ, ma bụrụkwazie onye e buru wee gaa na ngalaba ụlọ ahụike nkuzi mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Ukpo, n'okpuru ọchịchị ime obodo Dunukọfịa.

Dịka otu onye nche ọnọmgbeomere, bụ Maazị Alison Chinweze siri kọwaa, ihe mberede okporoụzọ ahụ dapụtara n'agbàtà elekere iri na abụọ na elekere mbụ nke ime anyasị ụbọchị Wenezdee.

Ọ dị ncheta na ụdị ihe mberede dị etu ahụ emebụọla ọtụtụ ugboro n'ebe ahụ n'oge gara aga, bụzị nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ òkù ka a chọọ ihe a ga-eme banyere ihe ahụ a rụnyere n'okporoụzọ ahụ, maka na o buru ibu nke ukwuu karịa etu o kwesiri ịdị.

Oge mbụ ihe ahụ wètèrè ihe mberede okporoụzọ, bụ nke metụtara mmadụ iri n'ọnụọgụ, otu onye ọrụ ụlọọrụ ahụ na-arụ okporoụzọ ahụ, bụ ụlọọrụ RCC kwùrù na ihe kpatara ihe mberede ahụ jiri dapụta bụ maka na ha akabèghị ụzọ ahụ akara ebe kwesiri ekwesi, ma kọwaa na ha mepere ụzọ ahụ n'ihi etu ndị mmadụ si acha ha ọkụ ka ha meghee okporoụzọ ahụ n'ebughị ụzọ nyegasịa ya akara ebe kwesiri ekwesi. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484