N'Ogun, E Jidela Nwoke Gbara Ahọ Iri Isii Na Anọ Kwasòrò Nwa Ahọ Abụọ Iko

Sep 14, 2021 - 22:20
 0
N'Ogun, E Jidela Nwoke Gbara Ahọ Iri Isii Na Anọ Kwasòrò Nwa Ahọ Abụọ Iko

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ bụrụ na a pịaghị ngwere ụtarị, ọ naghị ama na ọ gbà ọtọ. Ọ na-abụ a na-etigbu, ọ ka na-arịpụta, ị mara na ihe a na-etinwu agwụbeghị ebe o si apụta.

Ka ọ dị taa, aka ndị uweojii na steeti Ogun anwụchiela otu agadi nwoke gbara ahọ iri isii na anọ maka ịkwasò nwatakịrị nwaanyị gbara naanị ahọ abụọ iko n'ike

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Ogun, bụ DSP Abimbola Oyeyemi, bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ n'isi obodo steeti ahụ bụ Osogbo.

Dịka o siri kọwaa, agadi nwoke ahọ iri isii na anọ ahụ aha ya bụ Maazị Ayotunde Taiwo bụ onye a nwụchikọrọ oge nne nwata nwaanyị ahụ wetechara mkpesa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na mpaghara Agbado ụbọchị Tuzdee banyere nke ahụ.

O kwuru na nwaanyị ahụ kọwara na ọ chọpụtara na nwa ya nwaanyị anaghị aganwuzị ije nke ọma dịka o si aga na mbụ, bụkwazị nke mere ka o leruo ya anya nke ọma n'ahụ, wee chọpụta na ọbara si n'akụkụ ahụ nwaanyị ya were apụta. Ọ sị na oge ọ jụzịrị nwa ya nwaanyị ihe mere ya, na ọ tụrụụrụ ya aka n'ụlọ dị na ncherịtaihu ụlọ nke ha.

Dịka o siri kwuo, nwaanyị ahụ gàrà n'ụlọ ahụ, wee hụ ka nwoke ahụ na-asụ uwe ime ya ọbara gbasara na ya, nke na-egosi na ọ pịara nwata nwaanyị ahụ ọkụ n'ezie ma na-asụchapụzị ọbara nke gbasara ya n'ákwà. Nke a mezịrị ọ ji wee wègazie mkpesa ahụ n'aka ndị uweojii banyere ihe ahụ nwoke ahụ mere.

Nke a, dịka DSP Oyeyemi siri kọwaa, mèzịrị ka onyeisi ndị uweojii ji ọkwa DPO na mpaghara ahụ, bụ CSP Kehinde Kuranga ziga ndị ọrụ ya n'ebe ahụ ozigbo, ya wee nwọchikọọ ya bụ mkpi na-agbàrá ọha ewu nà akwara amaghị ókè ala, bụ Maazị Taiwo; aka abụọ wee ghọọ ya otu aka.

DSP Oyeyemi mèkwàzịrị ka a mara na a kpọrọla nwatakịrị ahụ wee gaa ụlọọgwụ maka inye ya ọgwụgwọ; ma kọwakwa na DPO ahụ enyela ntụziaka ka e nyefee okwu ahụ n'aka ngalaba na-ahụ maka ihe metụtara ezinụlọ bụ ngaalaba 'Family Support Unit' dị n'Ota, iji mee nnyocha miri èmì banyere nke ahụ. O kwukwazịrị na a ga-akpụpụ nwoke ahụ ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha banyere ihe ahụ o mere.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484