N'Ogun, Otu Nwaanyị Ereela Ụmụ Ya Abụọ N300,000 Maka Ihe Isi Ike

Jun 18, 2021 - 21:12
 0
N'Ogun, Otu Nwaanyị Ereela Ụmụ Ya Abụọ N300,000 Maka Ihe Isi Ike
Imoleayo na Agoro

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii na steeti Ogun anwụchikọọla otu nwaanyị gbara afọ iri atọ na ise aha ya bụ Blessing Ebuneku Agoro maka ire ụmụ ya ụmụnwaanyị abụọ n’ọnụego dị puku narị naịra atọ (N300,000).

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Ogun, bụ DSP Abimbola Oyeyemi n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ.

Dịka o siri kọwaa, nwaanyị ahụ, onye kwuru na di ya gbahapụrụ ya, ma hapụrụ ya ilekọta ụmụ ya nwaanyị Semilore Agoro (gbara afọ anọ) na Deborah Agoro (gbara afọ abụọ) kọwàrà na o rere ụmụaka ahụ n’ihi ihe isi ike.

DSP Oyeyemi kwùrù na a nwụchikọrọ nwaanyị ahụ site na mkpesa nke di ya bụ Oluwaseyi Agoro mere n'ogige ụlọọrụ ndị uweojii a kpọrọ 'Redemption Camp Divisional Headquarters' banyere ihe ahụ nwunye ya mere.

O kwuru na nwoke ahụ gwara ndị uweojii na ya mechara njem, chighata azụ, ọ hụghịzị ụmụ ya abụọ; ma kọkwara ha na mbọ niile ọ gbara iji mata ebe ụmụ ya nọ màrà afọ n’ala nke mere o jizịrị wètá mkpesa ahụ n’ogige ndị uweojii.

DSP Oyeyemi gàkwara n'ihu kọwaa na mgbe ha nwètèchara mkpesa ahụ, na onyeisi ndị uweojii na mpaghara ahụ, bụ CSP Alabi Akinjide kpọkuru ndị ọrụ ya ozigbo ma nye ha ntụziaka ka ha ga nwụchikọọ Blessing. Ha wee gaa, chọọ ma jide ya.

Ọ bụzị mgbe e jidechara ka nwaanyị jiri wee nye nkọwa ahụ banyere etu ya na ije siri gaa, ma kọkwara ha na di ya hapụrụ ụlọ kemgbe ahọ abụọ gara aga. O kwukwara na mgbe ahụ niile di ya anọghị ya, na ihe siiri ya ike nke ukwuu, ọkachasị ilekọta na ịzụ ụmụaka abụọ ahụ, tinyere ụmụaka abụọ ndị nke ọzọ ọ mụtaara nwoke ọzọ.

Oriakụ Agoro gara n’ihu kwuo sị na ọ bụ mgbe ọ nọ na-eche ihe ọ ga-eme ka otu onye aha ya bụ Kolawole Imoleayo mere ka ọ mata dinanwunye nọ na Port Harcourt bụ ndị nke na-achọsi ụmụaka ike; wee dụọ ya ọdụ ka o ree ụmụaka ahụ. O kwuzịrị na oge ọ tụlechaara ya, wee hụ o nweghịzị ihe ọzọ ọ pụrụ ime, o were ree ha ụmụaka nwaanyị abụọ ahụ, resi ha di na nwunye ahụ n’ọnụego dị narị puku naịra atọ (N300,000).

DSP Oyeyemi kwuru na nkwuputa ahụ mere ka a nwụchikọkwuo Kolawole Imoleayo bụ onye nọ n’agbata nwaanyị ahụ na di na nwunye ahụ o resiri ụmụaka ahụ. Ọ gara n’ihu mee ka a mara na ndị ahụ a nwụchikọrọ na-enyeziri ndị uweojii aka n’ime nnyocha ugbua banyere okwu ahụ.

N'okwu nke ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Kọmishọna Edward Awolowo Ajogun nyere ntụziaka ka a hafee ndị ahụ n’aka ngalaba ọ dị n’aka, bụ ngalaba 'Anti-Human Trafficking and Child Labour Unit' nke 'State Criminal Investigations and Intelligence Department (SCIID)', maka ezi nnyocha.

Kọmishọna Ajagun nyekwàrà ntụziaka ka a zọpụta ụmụaka ahụ ma kpọghachiri ha nne na nna ha ozigbo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484