Ntọ̀ na Igbu Ọchụ: A Na-achọ Dibịa nà Mmadụ 20 Ndị Ọzọ Nọ́ n'Ọsọ Ugbua Achọ n'Anambra

Jan 26, 2022 - 20:59
 0
Ntọ̀ na Igbu Ọchụ: A Na-achọ Dibịa nà Mmadụ 20 Ndị Ọzọ Nọ́ n'Ọsọ Ugbua Achọ n'Anambra
Ndị ahụ a na-achọ achọ

.

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ na-abụ ọkụkọ nyụọ ahụrụ, ala achụba ya ọsọ.

Ka ọ dị taa, ndị uweojii steeti Anambra ekwuwaala na ha na-achọ otu onye a na-enyo ènyò na ọ bụ dibịa, ya na mmadụ 20 ndị ọzọ achọ ugbua, bụ ndị nọ n'ọsọ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo ènyò na o nwèrè ihe ha ma banyere ọnwụ mmadụ abụọ dapụtàrà na nsonso a n'obodo Ogwu-aniọcha dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru dị na steeti Anambra, ya na ntọ̀rọ́ a tọ̀ọ̀rọ̀ eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Oliver Chike Nnaji (Ezechukwukwadolu, nke atọ).

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti Anambra, bụ DSP Toochukwu Ikenga bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

O mere ka a mara na mmadụ abụọ ahụ e gburu egbu n'obodo ahụ na nsonso a bụ Chiifu Ajieh Anthony Nwanasor, na Chiifu Ikenna Ugochukwu; ma rịọkwazie onye ọbụla ma maọbụ nwee ozi ọbụla bara uru banyere onye ọbụla n'ime mmadụ iri abụọ na otu ahụ a na-achọ achọ maọbụ ebe a pụrụ inwete ha, ka onye ahụ kpọtụrụ ma mee ka ndị ọrụ nchekwa mara.

Dịka o siri kpọpụta, mmadụ iri na otu ahụ gụnyèrè: Okwudili Ogana, Chidi Ekpendu, Chukwunonso Udom (onye e ji Pikin wee mara), Amechi Akachukwu, Emmanuel Ejiofor, Christian Udeze, Chikezie Onwuka (onye e ji Osy Torture wee mara), Iweka Odogwu, Chimezie Okonkwo (onye e ji Danger wee mara), na Onochie Nwabugwu (onye e ji Young PG wee mara).

Ndị ọzọ gụ̀nyèrè Anayo Ubadi (onye e ji Agunechemba wee mara), Chibueze Egwenu, Charles Obi,  Aboy Udom, Chinedu Collins Nwonani, Onyebuchi Umuna (onye e ji Omeke wee mara), Ifeanyi Mbanugo (onye e ji Acid wee mara), Sunday Osadebe, Nduba Chibuzor, Amechi Adama, na Azuakonam Anyakodia. 

Bànyéré okwu ahụ a kpụ n'ọnụ, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng Echeng nyèkwàzịrị ụmụafọ steeti Anambra na ndị obodo Okwu-anịọcha owuweanya ma kwe ha nkwà na ụlọọrụ ya ga-aga n'ihu ịgbasi mbọ ike iji nwụchikọọ ndị ahụ a na-enyo ènyò ma hụkwa a gbásòrò usoro ikpe nkwụmọtọ.

O jikwazịrị ohere ahụ rịọ Ndị Anambra na ọhaneze ka ha nyere ndị ọrụ nchekwa aka n'ọrụ ha site n'inye ha ozi dị mkpa na ozi bara uru ga-enye aka ime ka ọrụ ha gaa siriri-werere. O kwekwàrà nkwà na ha ga-ekpùchi ma gharakwa ikwupụta aha maọbu ihe banyere onye ọbụla nyere ozi dị mkpa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484