Nturu Ugo APGA Ga Akwalite Ezi Ọchịchị Na Ebumnobi Ndị Igbo --- Obianọ

Oct 7, 2017 - 08:35
Jan 23, 2021 - 23:13
 0
Nturu Ugo APGA Ga Akwalite Ezi Ọchịchị Na Ebumnobi Ndị Igbo --- Obianọ

Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ ekwuona na ọ dị mkpa ka otu pati APGA turu ugo na nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu na steeti ahụ iji wee gaa n'ihu ịkwalite ezi ọchịchị na ebemnobi ndị Igbo na steeti ahụ. Ya bụ gọvanọ kwuputara nke a n'ụlọ ụka St. Mary (Katọliki) dị n'Ọraukwu n'okpuru ọchịchị Idemili Nọọtụ nke steeti ahụ n'ofufe nru dị nsọ achịkọbara iji wee gbaa ọnya ego maka ịrụ ọrụ n'ụlọ ụka ahụ.

Ọ mere ka a mara na ọ bụ naanị APGA bụ òtù pati ndị Igbo nwere n'ala Naịjiria ma sịkwa na ọchịchị ya adabeghị mba n'ụdị ọbụla n'ịtụpụta ezi atụmatụ mmepe na nke na-kwalite ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ kemgbe ọ banyere n'ọkwa ọchịchị.

Ọ kpọpụtara ọtụtụ ọrụ dị iche iche ọchịchị ya ji n'aka n'Ọraukwu, nke gụnyere ịrụgharị ahịa Eke Oye, ụlọ ahụike n'Ọraukwu, ịrụ ụzọ ahụ siri Ibenabo gaa Abacha, ịrụgharị ụlọ akwụkwọ Praịma dị n'obodo ahụ, na ihe ndị ọzọ, tinyere na gọọmenti ya eweela ụmụ afọ obodo ahụ n'ogoogo ọrụ dị iche iche n'ọchịchṅnọ ugbu a.

Ọ rịọrọ ndị Ọraukwu ka ha gaa n'ihu n'ịkwado ịzọ ọchịchịṅya nke ugboro abụọ ma kwe ha nkwa na ọ gaghị agharịpụ ha.

Ode akwụkwọ ukwu nke steeti ahụ bụ ọkammụta Solo Chukulobelụ, bụ nwa afọ obodo ahụ kwuru na n'ihi ihe gọvanọ ahụ megoro n'obodo ahụ, na o nweghị ihe ga-ezù ịkwụghachi ya, karịa ịtụnyere ya akwụkwọ ka ọ chịa nke ugboro abụọ.

N'okwuchukwu ya, onye Ọzịlarị Bishọọpụ nke achị Dịọsiisi Ọnịsha bụ 'Most Reverend' Dennis Isizọr kọwara mkpa ọ dị na ndị ụka Katọliki sonyesiri ike na nhọpụta ahụ na-akpụdobe nso na steeti ahụ site n'ịga ewere mpempe akwụkwọ ikike ha bụ votaas kaadị.

Ka ọ na-anabata ndị bịara ya bụ mmemme, eze ọdịnala nṅobodo ahụ bụ igwe Emeka Ọnụọrah gbara akaebe na mnwogha na ọrụ mmepe niile na-aga n'ihu na ngalaba niile nke steeti ahụ bụ n'ihi ezi ọhụhụ ụzọ nke gọvanọ Willie Obianọ, ma sịkwazie na ndị Anambra nwere nnọ ezi onye ndu ñụjuru mmiri ara afọ ma bụrụkwa onye ọnọdụ ụmụ mmadụ na-emetụ n'obi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.