N'Ukpor, Ndị APGA Emeela Emume Ị́kụ Ngazị n'Eze Maka Mmeri Ha Nwetara, Nabata Ndị Ọhụrụ

Dec 14, 2021 - 10:28
 0
N'Ukpor, Ndị APGA Emeela Emume Ị́kụ Ngazị n'Eze Maka Mmeri Ha Nwetara, Nabata Ndị Ọhụrụ

 By Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ oge óké oriri na ọṅụṅụ, inwe aǹụ̀rị, nà ikele ekele, ka ndị òtù ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance, APGA', n'Ukpor, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South' nke steeti Anambra merùbèrè óké mmemme maka mmeri ahụ dara ụda otu ndọrọndọrọ ahụ nwetara na ntuliaka nhọpụ̀ta ọkwa gọvanọ ahụ e mere na nsonso a na steeti ahụ.

Emume ahụ bụ nke e jiri ụka ịtụ mmamma wééré ọnọdụ n'ụlọuka 'St. Mary's Catholic Church, Ukpor' wee malite, ma bụrụkwa nke e mezịrị kpọmkwem na 'Rosewood Lodge' dị na be Maazị Emma Nwachukwu, n'Umuhu Ukpor, bụ́kwá nke ọtụtụ ndịisi na ndị otu APGA sonyere na ya n'uju.

N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisioche APGA na mpaghara okpuru ọchịchị 'Nnewi South', bụ Maazị Azubuike Osuchukwu kọwàrà na mmeri ahụ otu ndọrọndọrọ ahụ nwetara na nhọpụ̀ta ọchịchị ahụ e mere n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba bụ̀ ma mmezu uche Chineke, ya na ngosipụ̀ta ikike ndị mmadụ nwere n'ịhọpụta onye ga-achị ha.

Ọ kelere ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA na ndịisi ha n'ogoogo dị icheiche, ọ̀kàchàsị̀ n'Ụkpọ, maka mbọ niile ha gbara iji mee ka APGA nweta ya bụ mmeri na nhọpụta ahụ, n'agbanyeghị mgbapụ ụfọdụ ndị mmadụ gbapụ̀rụ̀ n'otu ndọrọndọrọ ahụ, na ihe ịmà aka ndị ọzọ dakwàsị̀rị̀ otu ndọrọndọrọ ahụ n'oge ahụ a na-akwádóbé ya bụ nhọpụ̀ta.

N'ozi nnọ́ọ̀ ya, onye lere ọbịa mmemme ahụ ma bụrụkwa onyendu APGA n'Ukpor, bụ Maazị Emmanuel Nwachukwu kwùrù na ya haziri mmemme ahụ maka ndị òtù ndọrọndọrọ ahụ iji nwee ọnụ, ma kelee Chukwu maka ya bụ mmeri APGA nwetara, ọbụladị dịka o kwuru na mmeri ahụ sitere n'aka Chineke, ma bụrụkwa nke dabàrà adabà n'ótù okwu Igbo a mà àmá, bụ 'Chinaewubeze', nke pụtara na ọ bụ Chineke na-eme ma na-ekpube okpueze.

Ka ọ na-akọwa ihe mere nà etu o siri họrọ, sonyere ma kwàdó APGA na Soludo n'abụghị otu ndọrọndọrọ ndị ọzọ, Maazị Nwachukwu, onye bụkwa onyeisi ọchịchị obodo 'Ukpor Improvement Union (UIU)' n'oge gara aga kwùrù hoohaa na APGA bụ òtù ndọrọndọrọ kacha mma ma ka kwụdosie ike na steeti ahụ, ọbụladị dịka o kwupụtara ezi ntụkwàsịobi o nwere na ọchịchị Ọ̀kammụ̀ta Chukwuma Soludo, n'okpuru APGA, ga-emekwa nke ọma karịa ka a tụrụ anya.

Ka ọ na-akpọpụtasị ụfọdụ atụmatụ ọhụrụ gbasara etu a ga-esi mee ka APGA na ndị òtù ya na-agawanye n'ihu ma na-emekwa nke ọma n'ime obodo ahụ na n'ebe ndị ọzọ; ọ gàrà n'ihu dụọ ndị òtù ahụ ọdụ ka ha nọgidesie ike n'ikwesi ntụkwasịobi, na-akwàlite ma na-akwàdó otu ndọrọndọrọ ahụ na ndịisi ha. Ọ́ gazị̀kwàrà n'ihu kwe ha nkwà na a gaghị agharịpụ ha.

A nọkwara na mmemme ahụ we nabata ndị dị icheiche batara ọhụrụ n'òtù ndọrọndọrọ ahụ site na mpaghara wọọdụ dị icheiche dị n'obodo ahụ.

N'okwu ya oge ọ nà-anabàta ndị ahụ batara ọhụrụ n'aha ndịisi otu pati ahụ, onyeisioche nchereogè n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South', bụ Maazị Chieloka Okoye kọwàrà mmeri ahụ APGA meriri nàkwà emume ahụ e mere ụbọchị ahụ dịka nke dabàrà adabà ma kwesikwa ekwesi. Ọ kọwakwara mbàta ahụ ndị ọhụrụ batara n'òtù ndọrọndọrọ ahụ dịka ihe ịgba akebe na APGA na-agawanye n'ihu, ma na-emekwa nke ọma.

Ọ kọrọ akụkọ etu ụfọdụ ndị a na-elegara anya n'òtù ndọrọndọrọ pati ahụ siri wee gbahapụ ha na mberede, wee sonyere òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ mgbe APGA kacha wee chọọ ha na enyemaka ha. O jikwazịrị ohere ahụ wee kelee Maazị Emma Nwachukwu na ndị ọzọ nyere aka n'ụzọ pụrụ iche ma lụ̀ọ́ ọgụ ka nwoke, iji hụ na APGA nwetara mmeri na ya bụ nhọpụ̀ta, ọkachasị n'ime obodo ahụ nà ná mpaghara ebe ndị ọzọ n'okpuru ọchịchị ahụ.

Ka ọ na-ekelekwa Maazị Nwachukwu maka ịkpọbàtàkwà ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu n'obodo ahụ ka ha bata n'òtù ndọrọndọrọ APGA;  Maazị Okoye jikwazị obi ụtọ nabata ma kelekwa ndị ahụ batara ọhụrụ ahụ maka ịhụ mkpa ọ dị ịbata n'APGA. Ọ gbàrà ha ume ka ha nọgide n'ikwesị ntụkwasịobi nye òtù ndọrọndọrọ ahụ na ndịisi ya, ma nyekwazie ha owuweanya na ha ga-ahụta ezi akparamagwa dị icheiche e ji mara òtù ndọrọndọrọ ahụ.

N'okwu ya n'aha ndị ọzọ, otu n'ime ndị ahụ a nabàtàrà ọhụrụ, bụ Maazị Walter Okafor (sitere Ukpor wọọdụ 5), mèrè ka a mara na ọ bụ kemgbe ahọ 2017 ka ya na ndị APGA malitere mekọba ihe, ọbụladị dịka o gosipụtazịrị ọṅụ o nwere ugbua na a nabatala ya kpọmkwem ịbụ onye òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ n'ùjú. O kwere nkwà ịdị na-akwàdo ya bụ otu ndọrọndọrọ nà ihe dị icheiche ha na-eme.

Ndị ọzọ a nabatara ọhụrụ n'APGA ụbọchị ahụ gụnyere: Chinedu Anyachor nke wọọdụ 6;  Pius Ujubonu nke wọọdụ 1;  Chidi Okonkwo nke wọọdụ 6;  na Kenechukwu Mbanude nke wọọdụ 4.

N'ajụjụọnụ ndị ntaakụkọ gbara ya, otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'otu ndọrọndọrọ APGA, bụ Maazị Chris Nwachukwu (sitere Ukpor wọọdụ 2), tòrò emume ahụ na mmemme nnabata ahụ, ọbụladị dịka o kwupụ̀tàrà nkwenyesike ya na APGA nwere ọdịnihu kacha mma.

Ndị dị icheiche sonyere na mmemme ahụ gụnyere: onyeisi ngalaba mmụta na mpaghara okpuruọchịchị 'Nnewi South', Oriakụ Nneka Ileka; ndị jigasị ọkwa ọchịchị dị icheiche, ndị otu ndị abụghị ụmụ amaala Ukpor, tinyere ndị òtù na ndịndu APGA na mpaghara wọọdụ isii niile dị n'obodo ahụ.

Emume ịkụ ngazị̀ n'eze, inye ndị ahụ a nabatara ọhụrụ uwe APGA, na ịkwe ukwe dị icheiche e ji mara APGA, sò n'ihe putakarịchara ìhè na mmemme ahụ. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484