Nwoke onye Edmonton adagbuona onwe ya na Cancun

Nwoke onye Edmonton adagbuona onwe ya na Cancun

Nwoke onye Edmonton adagbuona onwe ya na Cancun

Chris Rogers gbara afọ 21. A mụrụ ya na St. Albert, na Alberta. Ọ na-aga akwụkwọ na mahadum University of Alberta.

Ọ dagburu onwe ya na Great Parnassus Resort na Cancun, ebe ya na ndị enyi ya jere ịnwe ezumike.

Ozi anyị nwetere na-ekwu na Rogers jere n’ogige ebe a na-agba egwu ndị ntorobia n’ụlọ oriri na nkwari ahụ. Ọgụ dara ebe ahụ. A kụrụ Rogers ọkpọ n’imi. Orima-anya malitere buwe ya. Ọ ga-ghachiri n’ọnụ ụlọ nke ya n’ụlọ-elu họtelụ ahụ.

A sị n’orima-anya bugideziri ya, o si n’ụlọ-elu dapụ were nwụọ.