Nwunye M Amaghịzị Mma n'Anya M— Nwoke Dinara Nwa Ya n'Ogun

Apr 9, 2021 - 17:19
 0
Nwunye M Amaghịzị Mma n'Anya M— Nwoke Dinara Nwa Ya n'Ogun

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka abụọ aghọọla Maazị Ubong  Akpan otu aka, ka ndị uweojii nwetechara mkpesa banyere etu o si edina ma na-amazụrị nwa ya nwaanyị n'ezinụlọ be ya, n'enweghị onye ọbụla ma ihe na-aga.

DSP Abimbola Oyeyemi, bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Ogun mere ka ụwa mara nke a, ma kọwaa na a nwụchikọrọ ya bụ nwoke site n'aka ngalaba ọrụ uweojii dị na mpaghara Itele Ota oge ha nwetachara mkpesa site n'aka nwa ya nwaanyị banyere ihe ọ na-eme.

Dịka o siri kọwaa, nwata nwaanyị ahụ gbara naanị ahọ iri na abụọ (12yrs) wètààrà ha mkpesa na nna ya ahụ bụ Ubong Akpan (gbárá ahọ iri anọ na iteghete) malitere iri ya ọkọmbọ (ịkwaso ya iko) oge ọ dị naanị ahọ asaa, ma sịkwa ya ekwekwala ka mmadụ ọbụla mara ihe na-aga, maọbụkwanụ gwakwa onye ọbụla banyere nke ahụ.

Ya bụ nwata nwaanyị dị ahọ iri na abụọ ugbua kwukwara na nna ya ahụ apịala ya ọkụ ahụ ọtụtụ oge, ruo ahọ ise zuru èzù, nke na o nweghịzị ike idìnwù ya maọbụ ịgbachị nkịtị, bụzị nke mere o jiri sị ka ọ bịa kpesara ndị uweojii, maka na ọ na-abụ onye gba nkịtị, ụwa agba ya nkịtị.

Dịka DSP Oyeyemi siri kọwaa, ndị uweojii jiri uche chọọ ya bụ nwoke ma nwụchikọọ ya ozigbo.

N'ajụjụọnụ agbara ya, ya bụ mkpi na-agbara ọha ewu, bụ Maazị Ubong kwuru na o mere ihe ahụ n'eziokwu, ma kọwaa na ọ bụ ọrụaka ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ, n'ihi na ekwensu dị aghụghọ nke ukwu.

Oge a jụrụ ya banyere nwunye ya, o mere ka a mara na nwunye ya ahụ na-akazị nka ma na-ajọkwazị njọ n'anya ya, nke na ọ naghị enwezịkwa mmasị ọbụla n'ebe ọ nọ, ma ya fọdụzie iri ya ọkọmbọ. Ọ rịọkwazịrị ka a gbaghara ya maka ihe ahụ o mere.

Ka ọ dị ugbua, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Edward Ajogun enyela ntụziaka ka e wega okwu ahụ n'aka ngalaba 'Family Support Unit' nke ụlọọrụ uweojii steeti ahụ, dị n'Ọta, maka imekwu nnyocha banyere arụrụala ya bụ nwoke, nke, mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ya ụlọikpe. 

CP Ajogun nyèkwazịrị ntụziaka ka a kpọrọ nwata nwaanyị ahụ gaa ụlọọgwụ iji lelee ya ahụ, mara ka ọnọdụ ahụ ya siri gbata kwụrụ, ma nyekwa ya ọgwụgwọ kwesiri ekwesi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484