Ọ Tọghị M Ụ̀tọ, Ọ Bụ Ọrụaka Ekwensu — Nwoke Kwasoro Agadi Nwaanyị Iko

Jan 17, 2022 - 20:45
Jan 17, 2022 - 20:54
 0
Ọ Tọghị M Ụ̀tọ, Ọ Bụ Ọrụaka Ekwensu — Nwoke Kwasoro Agadi Nwaanyị Iko

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Maazị Dan’asabe Eddo, bụ onye e jidere na nsonso a maka ịkwasò agadi nwaanyị gbara ahọ iri asatọ (80yrs) iko n'íké ekwuola na ọ bụ ọrụaka Ekwensu tinyere ya n'ụdị ọnwụnwa ahụ, nke na ọ hapụzịrị ime ka mmadụ, mebezie ka mkpi.

Ya bụ nwoke bụ onye gbara ahọ iri anọ na atọ, ma bụrụkwa onye a nwụchikọrọ site n'aka ndị uweojii n'ime steeti Nasarawa, ka ọ kpachara arụ ahụ na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Kokona dị na steeti ahụ. 

Ọ bụzị oge ndị nta akụkọ na-agba ya ajụjụọnụ mgbe ndị uweojii na-akpụgharị ya n'isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ dị na Lafia ka o jiri ọnụ ya wee kwuo na o mere ihe ahụ n'eziokwu, ma kọwaa na ọ bụ ọrụaka Ekwensu, n'ihi na o jighị anya ya wee mee ya bụ ihe.

Na mbụ n'okwu ya banyere arụrụala ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ ASP Ramhan Nansel kọwara na a nwụchikọrọ nwoke ahụ mgbe e nwetechara mkpesa na mpaghara ogige ụlọọrụ ndị uweojii dị na Garaku banyere ihe ahụ o mere.

Ka o rijuru ọ̀kọ̀mbọ̀ afọ ka o siri gụọ ya, ọ matùrù ma rie mbọmbọ ọsọ.

O kwuru na ndị ọrụ ha nwètàrà mkpesa na nwoke ahụ, bụ́ Dan’asabe Eddo (onye gbárá ahọ iri anọ) ma bụrụkwa onye obodo Kubasha dị n'okpuruọchịchị ime obodo Kagarko nke steeti Kaduna, mana o bì na Garaku dị n'okpuruọchịchị ime obodo Kokona nke steeti Nasarawa jìrì anyasị wee mịbànyé n'ụlọ otu agadi nwaanyị gbara ahọ iri asatọ, onye bikwa naanị ya n'otu obodo ahụ; o wee dakpò nwaanyị ahụ n'íké, kwuchie ya aka n'ọnụ, mà mazụrịa ya. 

ASP Nansel kwùkwàrà na ngwangwa ha nwetechara mkpesa ahụ, nà ndị uweojii ahụ jikèrè ozigbo wee chọrọ nwoke ahụ gaba, wee mechaa nwụchikọọ ya.
Ọ bụzị oge a na-agba ya ajụjụọnụ banyere ihe ahụ o mere ka nwoke ahụ jiri ọnụ ya wee kwete ma sàá asịsà na ọ bụ ya mere ihe ahụ n'eziokwu, kọ́ọ́ ka o siri gaa, kwuo na ọ bụ ọrụaka Ekwensu, ma rịọ ka a gbaghara ya.

Ka ọ dị ugbua, Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Adesina Soyemi enyela ntụziaka ka e nyefèé okwu ahụ n'aka ngalaba 'State Criminal Investigation Department (SCID)' dị na Lafia ka e wee mee nnyòcha miri èmì banyere ya.

Ya bụ onyeisi ndị uweojii jìkwàzịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma dụọ ọhaneze ndị nwere agadi na ndị katagoro ahụ n'ụlọ ọdụ ka ha na-eleru ma na-elekọta ha anya nke ọma, iji wee zeere ụdị ọdachi dị etu ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484