Ọba Akwụkwọ Anambra Agbasàárá Ụmụnyaanyị Ozi Ọrịa Kansà n'Ime Obobo

Mar 1, 2021 - 21:44
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Agbasàárá Ụmụnyaanyị Ozi Ọrịa Kansà n'Ime Obobo

Izunna Okafor


A kpọkuola ma gwa ụmụnwaanyị ka ha gbaa mbọ na-enyòcha ara ha na akụkụ ahụ ha ndị ọzọ na mgbe na mgbe, dịka ụzọ kacha mma isi chọpụta ma gbochie ọrịa kansà nà ọrịa ndị ọzọ na-efe èfè n'ogè.

Nke a bụ 'isi sekpụ ntị' na mmemme inye nkụzi banyere ọrịa kansà bụ '2021 Cancer Awareness Campaign', bụ nke a chịkọbàrà site n'aka Ọba Akwụkwọ Steeti Anambra, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ na ngalaba ọba akwụkwọ ahụ dị n'Ihembọsị, n'okpuruọchịchị ime obodo Ekwusigo dị na steeti Anambra.

Ya bụ mmemme a chịkọbara maka ụmụnwaanyị bụkwà nke ọba akwụkwọ ahụ jiri wee merùbe mmemme ụbọchị ọrịa kansà nke ahọ 2021.

N'okwu ya oge ọ na-enye nkụzi na steeti ahụ, Dọkịta A.B.C. Ikeano nke ụlọ ahụike nkụzi Mahadum Nnamdị Azikiwe dị na Nnewi kọwara ọrịa kansa dịka ntopùte nke anụ ahụ n'ụzọ ekwesighị ekwesi n'ahụ mmadụ, ma mee ka a mara na kansà ara na kansà nke na-eme n'àkpà nwa (cervical cancer) so n'ụdị kansà ụmụnwaanyị kàchà arịa, ma sòkwa na kansa kacha egbu mmadụ na mba ụwa.

Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche e ji ama ọrịa kansà ndị ahụ, kpọpụta ihe na-akpata ha, ma kpọpụtasịkwa usoro dị iche iche a pụrụ isi gbochie maọbụ gbanahị ọrịa ndị ahụ, ọbụladị dịka o mere ka a mara na a pụrụ iji ọgwụ HPV wee gbochie ọrịa kansa nke ahụ na-eme n'àkpà nwa, site n'ịgba ya ụmụaka ụmụnwaanyị nọ n'agbata ahọ 9—26.

O mere ka a mara na nwaanyị ényēghị nwa ara nke ọma so n'ihe na-ebute kansà ara, ebe nwaanyị inwe ọtụtụ nwoke ya na ha na-akwa iko sokwà n'ihe kacha ebute ọrịa kansa nke na-eme n'àkpà nwa, ọbụladị dịka ọ dụzịkwara ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha na-enyocha ara ha na ahụ ha kwà mgbe, ma na-akpọtụrụkwa onye ọrụ ahụike oge ọbụla ha hụtara ihe dị àñaa n'ahụ ha, maka na ịchọpụta ọrịa ahụ n'oge na-eme ka ọgwụgwọ ya dị mfe.

N'okwu nke ya, onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra bụ Dọkịta Nkechi Udeze mere ka a mara na ọba akwụkwọ ahụ achịkọbala ụdị ọzụzụ dị etu ahụ n'obodo ahụ n'ahọ 2018, ma kwuo na ya bụ mmemme, nke so n'ọrụ mgbasaozi ahụike ọba akwụkwọ ahụ na-arụ, bụ nke ebumnobi ya bụ iji kụziere ndị mmadụ ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere ọrịa kansà nakwa etu ha pụrụ isi gbanahị ha.

O kèlèrè Agbalanze RJC Arazu bụ nwaafọ obodo ahụ, onye o kwuru na ọ kwàdòrò ime ụmụnwaanyị sonyere n'ọgbakọ nkụzi ahụ nnyocha maka ọrịa kansa akpa nwa n'efù, ọbụladị dịka o nyere ụmụnwaanyị ahụ ndụmọdụ ka ha tinye ihe niile ha mụtara na mmemme ahụ n'ọrụ, ma na-esonyesikwa ike n'ụdị ọgbakọ nkụzi dị etu ahụ, karịa ịga naanị ọkpụkpọ oku ndọrọndọrọ ọchịchị.

N'akụkụ nke ya, otu onye ọrụ ọba akwụkwọ ma bụrụkwa onye nkụzi na mahadum, bụ Oriakụ Ngozi Osuchukwu kọwara ọgbakọ nkuzi ahụ dịka nke magburu onwe ya, n'ihi na o meela ka ndị sonyere na ya marakwuo ọtụtụ ihe banyere ọrịa kansà, na ụzọ e si agbanahị maọbụ na-egbochi ya, tinyere ihe ndị ọzọ ha mụtara n'ebe ahụ ga-enyere ha aka ịkwàlite ọnọdụ ahụike ha.

Ọ kọwara mkpa ọ dị mmadụ inyòchà onwe ya mgbe niile na ịchọpụta ọrịa n'oge, ma kpọkuzie ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ n'obodo dị iche iche ka ha ñòmie Agbalanze Arazu site n'inye ụdị nkwàdo ahụ o nyere, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ na-ewèta.

N'ozi ekele ya, onyeisi ọba akwụkwọ Ihembosi, bụ Oriakụ Kevina Madubuike kwupụtara obi ụtọ ya banyere etu ndị mmadụ siri sonye na mmemme ahụ, nà ezi ihe dị iche iche si na ya bụ ọgbakọ wee pụta, ma kelee ọba akwụkwọ steeti Anambra na ndị ọzọ tụnyere ụtụ n'ụzọ dị iche iche iji mee ka ya bụ mmemme gaa nke ọma, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị obodo ahụ ka ha na-abịa n'ọba akwụkwọ ahụ na-agụ akwụkwọ oge niile, maka na ọ bụ ha ka a rụụrụ ya.

Otu onye n'ime ndị sonyere na mmemme ahụ, bụ Oriakụ Justina Agbodike onye sitere Ụmụnakwa Ihembọsị gbàrà akaebe na ya bụ mmemme emepeela anya ya na uche ya ịmata na ịmụta ọtụtụ ihe dị iche iche ọ mabụghị banyere ọrịa kansà. O kelezịrị ndị chịkọbara mmemme ahụ, ma kwe nkwà iburu ozi ahụ na ihe dị iche iche ọ mụtara n'ebe ahụ wee bàá n'ime obodo ya ma kụzikwara ya ụmụnwaanyị ndị ọzọ.

N'aka nke ya, onye ọzọ sonyere na mmemme ahụ, bụ Oriakụ Amaka Alor kpọkuru ụmụnwaanyị ka ha na-eme nnyòcha ahụ ha oge niile.

Mmemme ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee nye nkụzi, jụọ ajụjụ banyere ọrịa kansa, kèàá uwe mkpuch ihu site n'aka ọba akwụkwọ Anambra, nye nkụzi banyere etu e si enyòcha ara, ma mekwa ụmụnwaanyị ahụ nnyocha n'efu maka ọrịa ka nsa akpa nwa, bụ nke e mere site n'aka onye ọrụ ahụike Nonye Egbuaba.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484