Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Akwụkwọ na Mba Ụwa

Apr 28, 2021 - 21:17
Apr 28, 2021 - 21:19
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Akwụkwọ na Mba Ụwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ụmụakwụkwọ ọdụ ka na-ahụta akwụkwọ na ịgụ akwụkwọ dịka ihe dị oke mkpà maka ha iji mee nke ọma n'agụmakwụkwọ ha, nwee ezi ọgụgụisi ma bụrụkwa ndị maara nke ekwe na-akụ n'ihe bànyere mmụta.

Ndụmọdụ a bụ nke e nyere site n'ọnụ onyeisi ọba akwụkwọ Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze, n'okwu ya na mmemme imerube ụbọchị akwụkwọ na mba ụwa, bụ nke a chịkọbara site n'aka ọba akwụkwọ ahụ. Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige ọba akwụkwọ steeti Anambra dị n'Awka,  ma bụrụkwa nke dọtara ụmụakwụkwọ sitere ụlọakwụkwọ dị iche iche dị na gburugburu Awka, ndị nkụzi, ndị ọrụ ọba akwụkwọ, na ọtụtụ ndị ọzọ, ndị bịara ịkwanyere óké ụbọchị ahụ ùgwù.

Dọkịta Udeze mere ka a mara na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị òtù mba ụwa 'United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization (UNESCO)' wepụtara iji kwanyere akwụkwọ ùgwù na mba ụwa, kọwaa uru akwụkwọ bara, ma kwalitekwa ịgụ akwụkwọ. Ọ kọwara akwụkwọ dịka ihe bara ọtụtụ uru a pụghị ịgụta ọnụ, ma kpọkuzie ụmụakwụkwọ ka ha na-agụsi akwụkwọ ike.

O chètààrà ha na e nwogharịala ọba akwụkwọ steeti ahụ na ngàlaba ya dịgasị ebe dị iche iche, ma kwajube ọtụtụ akwụkwọ bara uru na ya, ma kpọkuzie ụmụakwụkwọ ahụ na ọhaneze ka ha na-abịa ebe ahụ na-agụ, ma na-agbaziri akwụkwọ, n'ihi na ọ bụ ha ka a rụụrụ ọba akwụkwọ ahụ.

Ya bụ onyeisi ọba akụwkwọ Anambra gakwara n'ihu gwa ụmụakwụkwọ ahụ ka ha kaba ahụ mụtakwa ka e si agụ ma na-edekwa n'asụsụ Igbo; ọbụladị dịka ọ gwakwara onye ọbụla nwere mmasị ịgụ Igbo na mahadum ka ọ gaa n'ihu mee nke ahụ n'enweghị obi abụọ n'ihi na a na-achọzịkwa ndị gụrụ asụsụ Igbo aghara aghara ugbua, ma n'ala Nigeria ma na mba ofesi.

Na mbụ n'okwu ya, onyeisioche na mmemme ahụ, bụ Oriakụ Ngozi Osuchukwu kpọpụtasịrị uru dị iche iche akwụkwọ na ịgụ akwụkwọ bàrà, ma dụọ ụmụakwụkwọ ahụ ọdụ ka ha na-agụ akwụkwọ kwesiri ekwesi, iji nyere ha aka na ndụ, karịa ịgụ nke ezighị ezi. Ọ gwakwara ha ka ghara ịgụ akwụkwọ naanị ka ha were mee nke ọma n'ule, kama ha gụba akwụkwọ iji mụta ihe ma bawanye ọgụgụisi ha.

Na ntụnye nke ya, Oriakụ Chika Kenneth Esenwune, nke ụlọ mgbasaozi Radio Nigeria kwupụtara afọ ojuju ya banyere ihe ngosi dị iche iche ụmụakwụkwọ ahụ mere ebe ahụ, ọkachasị nke ha mere n'asụsụ Igbo, ma gwakwa ụmụakwụkwọ ahụ ka ha gharakwa ileghara akwụkwọ anya.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Oriakụ Okpalaezeukwu Nkechi, bụ onyenkụzi n'ụlọakwụkwọ 'Community Secondary School, Okpuno', na Nwabunwanne Victoria Oluchukwu, bụ nwata akwụkwọ sitekwara ụlọakwụkwọ ahụ, kọwara na ha mụtàrà ọtụtụ ihe na mmemme ahụ, kelee ndị haziri ya, ma gwakwa ha ka ha jisie ike na-eme mmemme ahụ kwa ahọ ọbụla.

E wezuga ihe ndị ọzọ, a nọrọ na mmemme ahụ kọọ akụkọ ihò, mee ihe ngosi ejije, kwuo okwu ntabi ire, gụọ akwụkwọ site n'aka ụmụakwụkwọ ahụ, ma nyekwazie akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche nyegara ụlọakwụkwọ dị iche iche sonyere na mmemme ahụ, ka ha tinye n'ọba akwụkwọ ha.

Ụbọchị akwụkwọ na mba ụwa bụ nke a na-emerùbe n'abalị iro abụọ na atọ nke ọnwa Epure ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke e mere a gba nke mbụ ya n'ahọ 1995.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484