Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Ọnatarachi Mbà Afrịka

May 5, 2021 - 20:10
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Ọnatarachi Mbà Afrịka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ bụ ihe onye natara chi ya ka o ji eme ngàlá, maka na ọnatarachi onye bụ ùgwù onye.

N'ịgbaso nke a, ọba akwụkwọ steeti Anambra nọrọ ụbọchị Wenezdee wee merube emume ncheta ụbọchị Ọnatarachi Afrịka na Mba Ụwa, nke ahọ 2021.

Óké mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ na ngalaba ọba akwụkwọ steeti ahụ dị n'Amichi, n'okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ụmụakwụkwọ sitere ụlọakwụkwọ dị iche iche na steeti ahụ, ndị dị iche iche nwere mmasị n'ịkwalite ọnatarachi na omenala Igbo, ndị ọrụ ọba akwụkwọ na ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù.

N'okwu ọ gwara ọhaneze bịara mmemme ahụ, onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze mere ka a mara na o kwesiri ịbụ mmasị na ọrụ dịịrị onye Igbo ọbụla ichekwaba na ịkwàlìtè njirimara, ọnatarachi na omenala agbụrụ ya, n'ihi na etu ụfọdụ omenala na ọnatarachi ndị obodo dị iche iche, ọkachasị nke ndị Igbo, si anwụsịzị n'ike n'ike ugbua bụ nke na-agụ ákwá ma na-agbakwa anyammiri. 

Dịka ọ na-akọwa na ọ bụ òtù mba ụwa 'United Nations Educational Scientific and Cultural Organization' (UNESCO) hibèrè oke ụbọchị ahụ ka ọ ná-adị n'abalị ise nke ọnwa ise n'ahọ ọbụla; o mere ka a mara na ọba akwụkwọ steeti ahụ agbaala ọtụtụ mbọ ma ka na-agbasikwa mbọ ike n'ụzọ dị iche iche ugbua iji chekwaba ọnatarachi na ihe ọkpụ dị iche iche ndị Igbo nwere, bụ nke ọtụtụ n'ime ha na-achọzịkwa ịbụ ndị e chefuru echefu ugbua.

Dọkịta Udeze gàzịrị n'ihu kpọkuo ndị nne na nna, ndị nkụzi, na ndị Igbo niile n'izugbe ka onye ọbụla nye aka ma tụnye ụtụ nke ya n'ụzọ ọbụla o nwere ike n'ezi mbọ ahụ a na-agba iji chekwaba ma kwàlite njirimara na omenala Ndị Igbo, ọ kachasị asụsụ Igbo, site n'ịkụziri na inyefè ha n'aka ụmụ na-eto eto, iji hụ na ha anwụghị maọbụ fùó, dịka ndị òtù UNESCO buru n'amụma n'ahọ.

Na mbụ n'okwu mmàlite ya, onyeisioche na mmemme ahụ, bụ Maazị George Ezezinne bunyèrè ọba akwụkwọ Anambra ụkpa ekele maka isonye n'imerùbe ya bụ oke ụbọchị, tinyere mbọ niile dị iche iche ọ na-agba n'ichekwaba ọnatarachi ndị Igbo na n'ịkwàlitè mmụta, bụ nke mịtagoro ezi mkpụrụ n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche, ma jaakwa ha ike.

O kelere ọba akwụkwọ ahụ maka imerùbe mmemme ahụ nke ahọ a n'obodo ya bụ Amichi, ma kpọkuzie ndị Igbo ka onye ọbụla malite hụba asụsụ, omenala na ọnatarachi ndị Igbo n'anya ma jirikwa ha kpọrọ ihe, iji wee nwee mmasị na ọnụnụọkụ n'obi ichekwaba ha ka ha ghara ifù maọbụ nwụọ.

A nọrọ na mmemme ahụ wee gosi ọhaneze ụfọdụ akụrụngwa na ihe ọnatarachi dị iche iche e jiri mara ndị Igbo, nke gụnyere ekwe, ụgbọ anụ, eku osisi, ògbè, ètè, iko osisi, ụda, nzu, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ma nyekwa nkọwa ha nà ihe e ji ha eme, bụ nke a kọwara site n'aka Oriakụ Perpetual Okokwọ. 
Onye ọrụ ọba akwụkwọ ọzọ, bụ Maazị Peter Ibe nọkwàrà na mmemme ahụ wee kọwaara ụmụ na-eto eto mpụtara ihe dị iche iche na-egosi n'ala Igbo, dịka ọmụ nkwụ, na ihe ndị ọzọ.

N'okwu ha n'ótù n'ótù, ụfọdụ n'ime ụmụakwụkwọ ahụ sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Maazị Chinaza Okafor na Obiọrah Ugonna kọwara na ha mụtara ọtụtụ ihe na mmemme ahụ, ma kelekwa ọba akwụkwọ steeti Anambra maka ụdị ohere ọma dị etu ahụ.

A nọrọ na mmemme ahụ gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, maa mbèm, mee ejije na ihe ngosi dị iche iche site n'aka ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ ọba akwụkwọ Anambra.

A nọkwara ebe ahụ wee rie ezigbo nri ọdịnala ndị Igbo dị iche iche, ọkachasị ji a hụrụ ahụ, bụ nke e ji ụtazị mara abụba na mmanụ akwụ na-akwọ mụrị mụrị wee hazie, tinyere mmanya ngwọ e jiri wee gbanyere ya ụgbọ nwamkpi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484