Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Ụmụnwaanyị na Mba Ụwa

Mar 11, 2021 - 14:18
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Ụmụnwaanyị na Mba Ụwa
Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Ụmụnwaanyị na Mba Ụwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

A dụọla ụmụnwaanyị ọdụ ka ha bụrụ ndị kwụdosiri ike, ma na-azụlitekwa ụmụ ha nke ọma, dịka otu n'ime ụzọ a pụrụ isi dozie obodo, ma belata mpụ na arụrụala n'obodo.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze n'okwu ya na mmemme imerube ụbọchị ụmụnwaanyị na mba ụwa, bụ 'International Women's Day' nke ahọ 2021, bụ nke ọba akwụkwọ ahụ chịkọbara n'Akịlị-Ogidi dị n'okpuru ọchịchị Ọgbaru.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Dọkịta Udeze chètààrà ụmụnwaanyị sonyere na mmemme ahụ na oge agaala mgbe a na-ahụta ịzụ nwaanyị n'akwụkwọ dịka imefù ego, ma kọwaa ụmụnwaanyị dịka ndị nwere ọtụtụ ọrụ n'ịkwàlite mmepe obodo. 

Ọ kpọpụtasịrị Ngozi Okonjo-Iweala, Chimamanda Adịchie, Stella Odua na ndị ọzọ dịka ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị gosipụgoro na mmadụ ịbụ nwaanyị abụghị ihe mgbochi ọbụla nyegara nwaanyị ọbụla gụrụ akwụkwọ maọbụ nwaanyị pụrụ iche ịbụ ihe o kwesiri ịbụ ma ruo ogoogo ọ chọrọ iru n'ụwa.

Ọ dụrụ ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha guzoro, màá ihe ọbụla na-echere ha aka mgba aka, karịa ịdà ụrụhụ, ịnọ otu ebe, ịdabere na mmadụ, maọbụ ikoròpù n'ihi etu ọnọdụ siri dịrị ha

O kelere ụmụnwaanyị ahụ maka ịpụtà n'ìgwè wee sonye na mmemme ahụ, ma gwa ha ka ha nye aka na-azụ ma na-elekọta ụmụaka abụghị nke ha anya dịka ha si elekọta ụmụ ha, kụnye ezi mkpụrụ n'ime ụmụ ha, ma zụọ ha n'akwụkwọ etu o siri kwesi, n'agbanyeghị na onye ahụ ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ka ha wee baa uru n'ụwa.

Ọ kpọkuru gọọmentị, ndị isi ụlọọrụ dị icheiche na ndị ọzọ na-enye ọrụ, ka ha na-enye ọkanọnụọgụ ụmụnwaanyị ọrụ oge ọbụla ha na-ewè ọrụ, iji hụ na òkè ụmụnwaanyị efùghị, ma mekwa ka ha soro n'ihe a na-eme.

N'akụkụ nke, Onoowu nke obodo ahụ, bụ Onoowu Obi Izukanne kèlèrè ọba akwụkwọ Anambra maka imerùbe mmemme ahụ n'obodo ha, bụ nke na-egosi na ihe banyere ya bụ obodo na-emetụta ọba akwụkwọ ahụ n'obi, ma bụrụkwa nke na-egosi na ya bụ ọba akwụkwọ bụ nke ọhaneze na nke obodo niile n'eziokwu, n'agbànyèghị etu ọnọdụ siri dị. Ọ rịọkwazịrị ka e jigide ma kwàlite ezi njikọaka ahụ dịgoro n'etiti obodo ahụ na ọba akwụkwọ ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ụmụnwaanyị ahụ ka ha tinye ihe niile a kụziiri ha ebe ahụ n'ọrụ.

N'okwu ha n'ótù n'ótù, ụfọdụụ ụmụnwaanyị sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Oriakụ Mary Olisamah, Oriakụ Virginia Igama, na Oriakụ Theresa Ọgwụ kwuru na ha ga-achọ ka ụmụaka obodo ahụ gụọ akwụkwọ nke ọma, ma chọkwa ka e mepee obodo ha, tinyesie ya ihe dị icheiche e ji enyere ndụ aka, na ihe ndị ga-eme ka ịgụ akwụkwọ na-agụ ndị mmadụ agụụ, na-atọ ụtọ, ma na-adịkwa mfe, n'enweghị ihe mgbakasịahụ ọbụla.

Dịka ha na-arịọ gọọmenti ka ọ kwadoro ha agụmkwụkwọ ụtụtụ (maka ụmụaka ha) na agụmakwụkwọ mgbede (maka ndị okenye), ụmụnwaanyị ahụ jikwàrà ohere ahụ wee kpọkuo gọọmenti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemeka n'ọnọdụ ọjọọ okporoụzọ ha nọ na ya, ma tinyesikwa akụrụngwa ga-ebelatara ha ihe isi ike na-echere ha aka mgba iwepụta ọnatarachi ha ma tụnyekwa ụtụ nke ha n'ịkwalite mmepe obodo, dịka ụmụnwaanyị ime obodo na-arụsi ọrụ ugbo ike ha bụ.

N'ozi ekele ya, onyendu ụmụnwaanyị n'obodo ahụ, bụ Oriakụ Monica Osai, nke Oriakụ Victoria Osagi nọchitere anya ya gosipụtara obiañụrị na afọ ojuju ya banyere ihe dị icheiche nwaanyị ahụ mụtara na mmemme ahụ, ma kelekwa ọba akwụkwọ ahụ maka ibutere ha ozi na mmemme ahụ n'ime ụlọ be ha, ma kpee ka Chineke kwụghachi ha.

E wezuga ihe ndị ọzọ, a nọrọ na mmemme ahụ nye nkuzi banyere ụbọchị ahụ, kesàárá ụmụnwaanyị ahụ ihe mkpuchi ihu maka igbochi ọrịa nje korona, ma yọrịakwa ọmarịcha egwu ndị nne si n'aka Gozie Okeke.

Mmemme ụbọchị ndị nne na mba ụwa bụ nke e mere agba nke mbụ ya n'ahọ 1911, ma bụrụkwa mmemme e si na ya wee na-emerùbe ma na-akpọ òkù maka ịkwàlite ọdịmma na ikike dịịrị ụmụnwaanyị, na-akatọkwa imegide ụmụnwaanyị. Mmemme ncheta ụbọchị ụmụnwaanyị na-ewere ọnọdụ n'abalị asatọ nke ọnwa Maachị ahọ ọbụla.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484