Ọba Akwụkwọ Anambra Na Òtù Nnọrọonwe Emeela Ụbọchị Nwata Nwaanyị

Oct 18, 2020 - 00:48
Jan 25, 2021 - 00:48
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Na Òtù Nnọrọonwe Emeela Ụbọchị Nwata Nwaanyị

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

A kọwaala mkpà ọ dị ịkwàlite ụmụaka nwaanyị ịgụ akwụkwọ nke ọma, ma kpọkwa òkù ka e bèlata otu e si emekpà ụmụaka ụmụnwaanyị ahụ nakwa etu e si akpachàpụ ha n'akụkụ n'ụzọ ezighị ezi.

Nke a bụ isi sekpụ ntị ma bụrụkwa okwu a kpụ n'ọnụ na mmemme imerùbè ụbọchị nwata nwaanyị na mba ụwa (nke ahọ 2020), bụ nke a chịkọbàrà site n'aka ọba akwụkwọ steeti Anambra bụ 'Prof. Kenneth Dike Central E-Library', site na njikọaka ụlọọrụ 'Development Initiative for Technology and Empowerment' (DEVITEM), nakwa ụlọọrụ 'Davina Care Foundation'.

N'okwu ya na mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ na Nteje, obodo okpururu ọchịchị Oyi na steeti Anambra; onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze kọwàra ụbọchị ahụ dịka ụbọchị òtù mba ụwa bụ 'United Nations' mapụtara iji wee merùbe ncheta nwata nwaanyị, iji kpọọ òkù ka a na-enyekwu ha òhèrè ọma n'ezi ihe ọbụla dịka a na-enye ibè ha.

Ọ sịkwa na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị e wepụtàra iji kpọọ òkù ka e belata etu e si emekpà ụmụaka ụmụnwaanyị ahụ n'ihi nwaanyị ha bụ, ya na iji nyekwara ha aka iru ogoogo ha chọrọ iru n'obodo na na ndụ ha. 

Ọ kọwara isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a "Olu M, Olileanya Anyị Ha Nhàtá Nhà" (My Voice, Our Equal Future) dịka nke dabàrà adabà, ma kpọkuzie ụmụaka ụmụnwaanyị bịara mmemme ahụ ọdụ ka ha kwe ka ndị nọ na gburugburu nakwa ọha mmadụ nụrụ olu ha ma hụkwa ihe ha nwere ịtụnye maka ọdịmma nke ọha mmadụ, ma ugbua ma n'ọdịnihu.

Na ntụnye nke ya, onye nhazi ihe mmemme n'ụlọ ọrụ 'Development Initiative For Technology and Empowerment (DEVITEM)' bụ Oriakụ Ngọzị Osuchukwu kọwara na ma nwa nwoke na nwa nwaanyị dịcha mkpà n'ụwà, ma sịkwa na o kwesiri ka onye ọbụla na-emesò ha nke ọma dịka o siri kwesi, karịa imekpà otu onye maọbụ ibè ya ahụ, ọkachasị dịka e si emesò ndị nwaanyị.

Ọ dụrụ ụmụaka ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha gharakwa ikwe ka mmadụ ọbụla kwụsị maọbụ gbochie ha imezùpụta maọbụ ịchawapụtà ọmarịcha ọnatarachi ha nwere nà ihe ndị ọzọ Chineke jiri gọzie ha. Ọ gwakwazịrị ha ka ha gosi ụwa ihe pụrụ iche dị ha n'ime, ma gbasiekwa mbọ ike iji bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha, ma nwekwa ike ịtụnye ụtụ nke ha na mmepe obodo, ma ugbua, ma n'ọdịnihu.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ 'Davina Care Foundation' bụ Oriakụ Yohanna Racheal mèrè ka a mara na nwata nwaanyị ọbụla nwèrè ihe Chineke tinyere ya n'ime (dịka ọ dịkwà n'ụmụnwoke), ma gwazie ụmụaka ụmụnwaanyị bịara mmemme ahụ ka ha chọpụta ma gosi ụwa ihe ahụ pụrụ ichè Chineke tinyere n'ime ha. Ọ kọwara mkpà ọ dị na e bidoro na nwata wee kụzibere ụmụaka ahụ ihe ha kwesiri ịma n'oge, n'ihi na nke ahụ ga-enyere ha aka ịma aka nri ha na akaekpe ha, nyere ha aka ibido n'ogè gbaba mbọ, ma nyekwara ha aka ịbụ ndị bara uru n'obodo. Ọ kpọkukwazịrị gọọmenti na ndị nọ n'ọkwa ọchịchị n'ogoogo dị iche iche, ka ha gbaa mbọ tụnye ụtụ nke ha n'ịkwàlite ikike dịịrị ụmụaka ụmụnwaanyị, ọkachasị site n'inye ha òhèrè kwesiri n'ihe dị iche iche ha na-eme.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị nkụzi ụmụakwụkwọ ha sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Oriakụ Nkiruka Nwafor (nke ụlọakwụkwọ 'St. Paul's Nursery and Primary School, Nteje'); Nwaada Ifeoma Chukwubeze (nke ụlọakwụkwọ 'Mount Olive College, Umunya'), na Maazị Mbanugo Ekene (nke ụlọakwụkwọ 'Esedo Memorial Nursery and Primary School, Nteje') kèlèrè ọba akwụkwọ Anambra maka imerùbè mmemme ahụ nke ahọ a n'ebe ọ dị ha nso, nke mezịrị ka ụmụakwkwọ ha soro rita uru na ya, site n'ihe mmụta dị iche iche ha mụtara ebe ahụ. Ha kwezịrị nkwà iburu ozi ahụ wee lakwuru ụmụakwụkwọ ha ndị ọzọ.

Ka ọ na-ekwupụta uche ya banyere mmemme ahụ, otu nwata akwụkwọ sitere ụlọakwụkwọ 'Mount Olive College, Umunya' bụ Nwaada Igbokwe Chinaza mère ka a mara na mmemme ahụ na nkuzi dị iche iche e nyere ebe ahụ mèpèrè anya ya na uche ya ka ọ mara ụfọdụ ihe dị iche ọ mabụghị n'oge mbụ dịka nwata nwaanyị. O kelere ọba akwụkwọ Anambra na ụlọọrụ ndị ọzọ ya na ha jikọrọ aka wee hazie ihe mmemme ahụ, ma kwezie nkwà ime ka ụwa nụrụ olu ya ma hụkwa ihe o nwere ịtụnye na mmepe obodo, dịka nwata nwaanyị, ma ugbua ma n'ọdịnihu.

A nọrọ na mmemme ahụ mee ihe ngosi dị iche iche site n'aka ụmụakwụkwọ, ma nye nkuzi ma jụkwa ajụjụ banyere ihe metụtara ụmụaka ụmụnwaanyị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.