Obianọ Agaala Njem Nleta Ọzọ n'Ogìgè 'Awka Millenium City'
Izunna Okafor dere akụkọ a
Gọvanọ Willie Obianọ bụ Ọchịọra steeti Anambra ekwupụtala afọojuju ya banyere etu ọrụ si aga n'ogige 'Awka Millenium City', ogoogo e ji arụ ya bụ ọrụ, nàkwà etu ndị ji ọrụ ahụ si agbaso usoro nà nkwekọrịta ha na gọọmenti nwere were arụ ya bụ ọrụ.
Gọvanọ Obianọ kwuru nke a oge ọ gara njem nleta n'ogige ahụ a na-arụ n'Agụ Awka, bụkwa njem ya na ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n'ọrụ gọọmenti n'ime steeti ahụ soro wee gaa, iji leta ka ọrụ si aga n'ebe ahụ.
Ọ dị ncheta na ọmarịcha ogige ahụ bụ nke a na-arụ n'okpuru atụmatụ njikọaka gọọmenti na ndị nnọrọonwe, bụ atụmatụ 'Public-Private Partnership' (PPP), ma bụrụkwa nke a na-arụ n'ịza na ịgbaso ọkpụkpọ òkù 'Akụ Ruo Ụlọ' ahụ ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ na-akpọ ụmụafọ steeti ahụ bi na mba dị icheiche ka ha wèlataruo akụ ha ụlọ.
Ka ọ na-ekwu okwu n'ebe ahụ oge ọ gagharịchara gburugburu ogige ahụ, Gọvanọ Obianọ kwuru na afọ juru ya banyere ihe ọ hụrụ n'ebe ahụ nakwa etu e si arụ ya bụ ọrụ, ọkachasị dịka o siri metụta ịgbaso ogoogo e kpebiri na mbụ wee na-arụ ya.
Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ uru dị icheiche ogige ahụ ga-abà na etu ọ ga-esi kwàlite ọnọdụ mmepe, ma kọwaa na ogige ahụ ga-abụkwa ọkachamma dị na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria ma ọ bụrụ na a rụchaa ya, ọbụladị dịka ọ rịọkwazịrị ndị Anambra bi n'ebe dị icheiche ka ha tụnyere ma kwàdo ya bụ ogige, bụ nke nwere ọtụtụ ihe dị icheiche e ji enyere ndụ aka.
Ya bụ Gọvanọ jikwazịrị ọnụ ya wee gbaa akaebe na ọkpụkpọoku 'Akụ Ruo Ụlọ' ahụ ọchịchị ya na-akpọ nà-ámịtá ezigbo mkpụrụ, n'ihi na ọtụtụ ụmụafọ steeti ahụ na-azázị ya, ma na-ewèlatatuzị akụ ha ụlọ, bụkwa nke nyegoro aka n'ụzọ dị icheiche n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe na ọnọdụ akụnụba steeti ahụ.
N'akụkụ nke ya, onyeisioche ụlọọrụ MP-Infrastructure ji ọrụ ngo ahụ, bụ Chiifu Clement Nwogbo kọwàra na otu ihe iche aka mgba kacha gbaghàchi aka elekere azụ n'ọrụ ahụ bụ ịmịpụ̀sị̀ mmiri dị n'ebe ahụ, bụkwa nke ha mechagoro ugbua. O kelekwara Gọvanọ Obianọ maka ịtụnye ụtụ pụrụ iche n'ịkwàlite mmepe steeti ahụ, nakwa etu o si enye nkwàdo n'oge a chọrọ ya, bụkwa nke nyegooro ha aka n'ọtụtụ ụzọ dị icheiche iji hụ na ọrụ ọrụ ahụ na-aga n'ihu.
Dịka ọ na-enye nkọwa banyere ogoogo ọrụ ahụ nọ na ya ugbua, Maazị Nwogbo gàkwara n'ihu kọwaa na ha na-agbaso ogoogo mba ụwa ma jirikwa akụrụngwa a na-ahụta n'ogoogo mba ụwa were arụ ya bụ ogige, iji mee ka ọ bụrụ eji ama atụ nà ụdị nke a na-ahụtakwa n'ogoogo mba ụwa dị icheiche; o mekwazịrị ka a mara na ha na-agbasi mbọ ike nhọ na a rụchapụrụ ya bụ ọrụ n'oge a kara aka a.
Ọrụ ngo ahụ bụ nke e ji ego ruru nde dọla iri anọ na isii na ụma ise ($46.5m) were arụ, ma bụrụkwa nke gọọmenti wetere ala a ga-eji rụọ ya dịka otu n'ime ntụnye nke ya.
Dịka nkwekọrịta e mere siri dị, ọ bụkwa ụlọọrụ M-P Infrastructure ga-ewere pasenti iri asaa na atọ n'ime úrù ego a ga na-enweta n'ogige ahụ ma a rụchaa ya, gọọmenti ewere pasenti iri abụọ na anọ, ebe a ga-eji pasenti atọ fọrọ afọ wee na-echukwa obodo ebe ahụ a rụrụ ogige ahụ. Ọ bụkwazị n'ahọ 2019 ka e binyere aka n'akwụkwọ maka ịrụ ọrụ ahụ.
What's Your Reaction?