Obianọ Agbapee Atụmatụ Inye Ọzụzụ Maka Nchekwa Imeime Obodo

Dec 16, 2020 - 17:03
Jan 30, 2021 - 17:04
 0
Obianọ Agbapee Atụmatụ Inye Ọzụzụ Maka Nchekwa Imeime Obodo

Izunna Okafor

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obiano agbapeela amụma inye ọzụzụ maka nchekwa imeime obodo dị iche iche na steeti ahụ.

Mmemme ịgbape atụmatụ inye ọzụzụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ na nsonso a n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a chịkọbara site n'aka ụlọọrụ uweojii steeti ahụ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na nchekwa bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla, bụzị nke mere na onye ọbụla ga-etinye aka n'ọrụ, nyere ndị ọrụ nchekwa aka ịrụ ọrụ ha site n'inye ha ozi dị mkpa mgbe kwesiri ekwesi, ma mụrụkwa anya ka azụ oge niile, n'ihi na òké anaghị eri ihe onye mụ anya.

Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ osote ya, bụ Dọkịta Nkem Okeke kọwàrà nchekwa imeime obodo (community policing) dịka otu n'ime usoro kacha mma isi belata ma chụọ mpụ na arụrụala ọsọ ụkwụ erughị ala na Nigeria, ma kọwaa mkpa ọ dị na Ndị Anambra na ndị ọzọ bi ebi na steeti ahụ ga-ejikọ aka ọnụ, ha na ndị ọrụ nchekwa, iji kwalite ezi ọnọdụ nchekwa ndụ na akụnụba na steeti ahụ, ma n'oge mmemme ekeresimeesi a, ma mgbe e mechara ya.

Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche ọchịchị ya mepụtagoro na ngalaba nchekwa steeti ahụ, nke mezịrị Anambra jiri bụrụ steeti kacha wee nwee ezi ọnọdụ nchekwa n'ala Nigeria, ma kwe nkwà na ha agaghị ada mbà inye ụmụafọ steeti ahụ ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà.

Ya bụ Gọvanọ gakwazịrị n'ihu gwa ndị nwere ụlọ na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ ka ha gbaa mbọ na-achọpụta ihe niile dị mkpa ha kwesiri ịma banyere onye bi maọbụ chọrọ ibi n'ụlọ ha, ya na ihe onye ahụ na-arụ, tupu ha enye onye ahụ ụlọ, n'ihi na ọtụtụ ndị esitela n'emeghị nke a wee nye ndị ohi na ndị omekoome ụlọ n'amaghị ama.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi ndị uweojii na-elekọta mpaghara 13 dị n'Ukpo, bụ AIG Mohammed Danmalam mere ka a mara na onye ọbụla nwere ọrụ nchekwa dịịrị ya n'ebe ọbụla o bi maọbụ ebe ọ hụtara onwe ya, maka na ọ bụ ebe onye bì ka ọ na-awàchi. 

Ọ rịọkwazịrị ọha mmadụ ka ha na-enyere ha bụ ndị uweojii aka n'ọrụ ha, site n'inye ha ozi dị mkpa ga-enyere aka n'ọrụ, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ tụnye ụtụ nke ha na nchekwa obodo.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP John B. Abang kèlèrè aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Obianọ maka nkwàdo dị iche iche ọ na-enye ha, bụ nke na-eme ka ọrụ ha na-agara ha siriri-wèrèrè n'ime steeti ahụ ma na-amịtakwa ezi mkpụrụ.

Dịka ọ na-agwa Ndị Anambra ka ha ghara ịtụ egwù banyere mpụ na arụrụala na steeti ahụ n'ime oge mmemme ekeresimeesi a, ọ dụrụ ha ọdụ ka onye ọbụla kee nkwụcha oge niile ma hikwa asaa n'anya, ọbụla dịka o kwere nkwà na ha ga-aga n'ihu inye steeti ahụ ezi nchekwa bụ ịgba dịka ha si eme oge niile.

Ndị ọrụ gọọmenti, ndị ọrụ nchekwa,  ndị ntorobịa, ndị ndu ụka dị iche iche, nakwa ndị ndu obodo dị iche iche sonyere na ya bụ mmemme, ma bụrụkwa ndị a gwazịrị ka ha buru ozi ha nwetara n'ebe ahụ wee lakwuru ndị ngalaba ha dị iche iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.