Obianọ Agbapeela Àkwà Ngafè MCC Ọnịtsha Ka E Dozichàrà Ya

Nov 21, 2019 - 02:53
Jan 24, 2021 - 05:50
 0
Obianọ Agbapeela Àkwà Ngafè MCC Ọnịtsha Ka E Dozichàrà Ya

Izunna Okafor, Awka

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agbapeela àkwà ngafè okporo ụzọ ahụ dị na mpaghara MCC Ọnịtsha, ka ndị mmadụ malitekwa ịga na ya, dịka gọọmenti dozichàra ya ma mee ka ọ kwụrụ chịm ọzọ.

Ọ dị ncheta na ya bụ àkwà ngafè, nke ọtụtụ ụkwụ na-aga na ya kwa ụbọchị, bụ nke otu nnukwu ụgbọala suru n'ime ọnwa gara, we sugọọ ya, nke mezịrị ka ọ bụrụ ọnyà ọnwụ nyere si na ya agafe ụzọ awara awara ahụ, bụ nke mekawazịrị ka gọọmenti steeti ahụ mechigodi ya ma dozigharịa ya, iji gbanahị ihe égwù, ihe ọdachi maọbụ ihe mberede.

Ka ọ na-agbapegharị ya bụ àkwà, Gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara na ọ bụ ụlọ ọrụ ngo Julius Berger ka e nyèrè ya bụ ọrụ, iji rụọ ya n'ogoogo dị elu, maka oke mpà ya bụ àkwà dị nyere ndụ mmadụ, ọbụnadị dịka o nyèkwàzịrị ndị na-aga na ya bụ àkwà owuwe anya na ọ nọrọla n'ezi ọnọdụ siri ike ma dịkwa mma ụkwụ ịga ya ugbu a.

Gọvanọ, onye ọ bụ ya na ụfọdụ ndị isi ọchịchị steeti ahụ sòro wee gaa ya bụ njèm, nyekwazịrị ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka njem awele na steeti ahụ ka ha nwụchie ma onye ọkwọ ụgbọala ọbụla bufèrè ibu ókè na mpaghara ụzọ ọbụla na steeti ahụ n'ihi na ihe dị otu ahụ só ewèta àlà adịghị mma n'okporo ụzọ dị iche iche steeti ahụ.

N'akụkụ nkè ya Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr kọwara na ya bụ àkwà nke ogoogo ya site n'elu ala rùrù mità ise na ụma ise, nwètara ezigbo mmerụ ahụ oge ahụ ụgbọala ahụ sùrù ya, nke na nọmìrì n'ihe ruru sentimità iri atọ, bụzị nke mere e jiri mechie ma rụgharịa ya, ka ọ nọrọkwa n'egwu ọzọ.

Ọ kpọkuzịkwàrà ma dọọ ndị na-akwọ ụgbọala aka na ntị, ka ha zèéré ibu oke ibu, iji gbanahị imebisi okporo ụzọ ma ọ bụ iwèta ihe mberede, ọ kachasị ugbu a oge mmemme ekeresimeesi na-akpụdòbe nso.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.