Obianọ Akpọọla Oku Ime Aha Azikiwe Ka Ọ Dị Ọkpụtọrọkpụ

Nov 20, 2021 - 22:13
 0
Obianọ Akpọọla Oku Ime Aha Azikiwe Ka Ọ Dị Ọkpụtọrọkpụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọọla òkù ka emee aha Dọkịta Nnamdi Azikiwe lagoro mmụọ ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ karịa etu ọ dị ugbua.

Gọvanọ Obianọ kwupụtàrà nke a n'okwu ya na mmemme Nkụzi Zik (Zik Lecture) àgbà nke iteghete na agba nke iri ya, bụ nke weere ọnọdụ na Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị Tuzdee ma bụrụkwa mmemme a na-achịkọba kwà ahọ ọbụla iji kwanyere ya bụ oke mmadụ, bụ Azikiwe, ùgwù.

Ọ dị ncheta na ya bụ gọvanọ nọrọ n'ahọ 2019 wee kwuwaa na ụbọchị ahụ a mụrụ Zik, bụ abalị iri na isii nke ọnwa Nọvemba ahọ ọbụla ga na-abụzị ụbọchị ezumike na steeti ahụ, iji kwanyere ya ugwu. Ọ bụzị n'ịgbàkwụnye na nke ahụ ka Gọvanọ Obianọ jizị akpọ òkù ka e mee ka ụbọchị ezumike ahụ bụrụzie nke a ga na-enwezị na steeti niile dị na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ na n'ala Nigeria n'izugbe.

Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ odeakwụkwọ izugbe steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu, kpọkwàrà òkù ka e weghàchite ọmụmụ akụkọ ntọala n'ụlọakwụkwọ, iji mee ka ụmụakwụkwọ na ụmụ na-eto eto nwee ike ịghọta mbọ dị icheiche ndị nna-nna ha gbara nà àjà ha chụrụ, iji mee ka Nigeria guzoro. O kwupụtàkwàzịrị ezi olileanya o nwere na ya bụ ọgbakọ ga-amita ezigbo mkpụrụ n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe na ọganihu ala Nigeria, ma kwàlitekwa ezi ọchịchị.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onye ọbịa nyere nkụzi na mmemme ahụ ma bụrụkwa aka na-achị steeti Ekiti, bụ Gọvanọ Kayode Fayemi kpọrọ òkù ka a kwalitekwuo ezi mmekọrịta na ịdịnotu n'ala Nigeria, ma kwuo na ọ dịghị mma mmadụ ịma ụma egbu ibe ya n'ihe a gaara eji mkparịtaụka wee kpezie.

Dọkịta Fayemi, onye bụkwa onyeisioche otu jikọtara ndị Gọvanọ niile n'ala Nigeria gbàrà akaebe na Azikiwe gbara ezigbo mbọ ma mee ọtụtụ ihe a hụrụ anya iji mee ka ala Nigeria guzosie ike ma gbakwa mbọ pụtara ìhè n'ogoogo mba Africa, bụ nke mere e ji akpọ ya Zik nke Africa.

Na mbụ n'okwu mmalite ya oge ọ na-akọwa isiokwu mmemme ahụ, bụ “Nchekwa, ọchịchị, na mwilite obodo” onyeisioche mmemme ahụ ma bụrụkwa aka na-achị steeti Ebonyi, bụ Gọvanọ Dave Umahi, nke ọ bụ osote ya, bụ Dọkịta Kelechi Igwe nọchitere anya ya, kọwàrà nchekwa dịka isi sekpụ ntị na otu n'ime ihe kacha dị mkpa n'ọchịchị na n'obodo ọbụla

A nọrọ na mmemme ahụ wee waa achịcha bekee e jiri merùbe mmemme ncheta ụbọchị ọmụmụ Zik.

Ọtụtụ ndị dị icheiche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè nwunye Azikiwe, bụ Ọkammụta Uche Azikiwe; onyeisi mahadum Nnamdi Azikiwe, bụ Ọkammụta Charles Esimone, Sinetọ Ben Obi, Sinetọ Uche Ekwunife na-anọchite anya ọgbọ nta nkwado mpaghara Anambra etiti, onyeisi otu Ọhaneze Ndigbo tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche, bụ ndị bịara iso wee kwanyere agụ nwoke ahụ ùgwù.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484