Obianọ Eduola Anyechebelụ n'Iyi Ọrụ Dịka Ọkaikpe Steeti Anambra

Feb 19, 2020 - 20:43
Jan 24, 2021 - 01:02
 0
Obianọ Eduola Anyechebelụ n'Iyi Ọrụ Dịka Ọkaikpe Steeti Anambra

Izunna Okafor, Awka

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Tuzdee wee duo Ọkaikpe Ọnọchie Anyachebelụ n'iyi ọrụ dịka ọkaikpe steeti ahụ. Mmemme idu n'iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Akwa, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị selitere isi na ngalaba niile nke steeti ahụ sònyèrè na ya.

N'okwu ya oge ọ na-edu ya n'iyi ọrụ ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwàra ya bụ nwa amadi dịka onye pụrụ iche nakwa onye ma nke ekwe na-akụ na ngalaba ọrụ ikpe, dịka o siri gosipụta n'ime ọnwa ole na ole ọ nọrọ dịka onye jigodi ọkwa ahụ. Ọ sị na ya bụ nwoke rụpụtara ihe anya na-ahụ, ma kwukwazie na o nwèrè olile anya na ọ pụkwàrà iji ọkwa ahụ n'ozuzu okè, ya na ime ka ngalaba ọrụ ikpe steeti ahụ bụrụ ọkacha mma, ma nọrọkwa n'ezi ọnọdụ dị elu.

O tòkwàrà ngalaba ọrụ ikpe steeti ahụ maka ezi ọrụ ha na steeti ahụ nakwa otu ha si ekpechàpụ ọtụtụ ikpe e jigasị n'aka na steeti ahụ, ma dụkwazie ha ka ha gbaa mbọ mee ka ohèrè dị n'ụlọ mkpọrọ, site n'ilebàgàsị anya n'ọtụtụ okwu dị iche iche dị bànyere ndị nọ ebe ahụ.

Iji mezupụta nke ahụ, o nyekwàzịrị ha ndụmọdụ ka ha wepụta ụbọchị pụrụ iche ha ga-eji na-ekpe naanị ikpe gbasaara ohi na okwu ndị ọzọ yiri nke ahụ; ọbụnadị dịka o kwèkwazịrị ha nkwa na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịkwàdo ya bụ ngalaba iji rụpụtazuo ọrụ ya nke ọma na-enweghị egwù maọbụ ihe iche aka mgba ọbụla.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna ikpe nkwụmọtọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Uju Nwọgụ kọwàrà na ọ bụ idu n'iyi ọrụ ahụ bụ ihe ikpeazụ, dịka ọ dị n'usoro iguzobe onye ga-anọ n'ọkwa ahụ, n'ihi na òtù jikọtara ngalaba ikpe ala Nigeria, bụ 'National Judicial Council' adịlarị na mbụ nabata ya bụ nwa amadi, ebe ndị omebe iwu steeti Anambra nọrọ n'abalị iri na otu nke ọnwa a wee nabatakwa ya iji ọkwa ahụ. O kelekwazịrị Gọvanọ Obianọ maka ịkàpịà nke ahụ ọnụ site n'idu ya n'iyi ọrụ ahụ, ya na nkwàdo dị iche iche ọ na-enye ngalaba ikpe steeti ahụ kemgbe ọ batara n'ọkwa ọchịchị.

Na nzaghachi, ya bụ nwa amadi e dùrù n'iyi ọrụ, bụ Ọkaikpe Anyachebelụ, bụkwa onye obi dị kà ọkà e ghuru n'éjù ụbọchị ahụ, fọrọ èkele n'ụkpa wee bunye Gọvanọ Obianọ maka ịhụta ya dịka onye tozùrù òkè iji ọkwa ahụ, ya na nkwàdo niile ọ na-enye ya na ngalaba ahụ kemgbe e siri gùzobe ya n'abalị anọ nke ọnwa September ahọ 2019 dịka onye jigodi ọkwa ahụ, wee ruo ụbọchị ahụ e dùzịrị ya n'iyi ọrụ kpọnkwem.

Dịka ọ na-arịọ ka ezi mmekọrịta ahụ dị n'etiti alaka atọ nke steeti ahụ guzosie ike, Ọkaikpe Anyachebelụ kwèrè nkwà ileba anya n'ihe ahụ Gọvanọ kwùrù gbasaara ime ka ohere dị n'ụlọ mkpọrọ site n'ikpechapụ ikpe ndị e ji n'aka ngwangwa; ma kwuo na ya ga-agbakwa mbọ otu o siri kwesi, ịhụ na e mezùpụtara nke ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.