Obianọ Eduola Ọnwụamaegbu n'Iyi Ọrụ Dịka Ọka Ikpe Ukwu Steeti Anambra

Aug 8, 2019 - 18:56
Jan 21, 2021 - 18:57
 0
Obianọ Eduola Ọnwụamaegbu n'Iyi Ọrụ Dịka Ọka Ikpe Ukwu Steeti Anambra

By Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-abụ onye e nyèrè mara chịkwaa, e nyekwuo ya nke ka nkè. Ka ọ dị taa, aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ eduola oriakụ Ijem Ọnwụamaegbu n'ọrụ dịka ọkaikpe mkwụmọtọ steeti ahụ, na dịka nwaanyị mbụ na-eji ya bụ ọkwa. Oke mmemme idu n'iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, oge ndị isi ọchịchị steeti ahụ nwere nzukọ.

N'okwu ya oge ọ na-edu ya n'ọkwa ahụ, gọvanọ Obianọ mere ka a mara na ọchịchị ya na-agbasi mbọ ike ịhụ na o tinyere ọtụtụ ụmụnwaanyị n'ihe a na-arụ, ma kwuo na ya bụ agụ nwaanyị emeputala ihe a hụrụ anya na ngalaba ọrụ iwu, ọbụnadị dịka ọ dụrụ ya ka o were egwu Chineke rụọ ọrụ ya nke ọma, n'eleghị mmadụ anya n'ihu ma ọ bụ tụọ ụjọ maka ihe ọbụla.

O kwere nkwa ịhụ na e nwere ezi mmekọrịta n'etiti ngalaba ọrụ ikpe steeti ahụ na ọchịchị ya iji hụ na ọrụ ikpe mkwụmọtọ na-aga otu o siri kwesi na ya bụ steeti, ma gakwa n'ihu kwuo na ọchịchị steeti ahụ na-agba mbọ iwebàtà akụrụngwa ọgbara ọhụụ na ngalaba ahụ iji mee ka ọrụ dịrị ha mfe ma na-agakwa ọsọọsọ.

Na nzaghachi, oriakụ Ọnwụalaegbu tòrò ọchịchị steeti ahụ maka ịhụta ya dịka onye tozùzù oke wee guzobe ya n'ọkwa ahụ, ma kwekwazie nkwà na ndị ọkaikpe nọ na steeti ahụ na gọvanọ ga-aga n'ihu ịrụkọ ọrụ ọnụ.

Na mbụ n'ozi ya, onye ji ọkwa ' Chief Registrar' bụ oriakụ Chinyere Ossy-Okoye kwuru na ya bụ nguzobe n'ọkwa bụ nke kwesiri ekwesi, n'ihi na o tozùrù oke ma nwezùchakwa ihe niile akwụkwọ iwu ala anyị kpọpụtasịrị maka iji ya bụ ọkwa, ọbụnadị dịka o mere na òtù 'National Judicial Council' kwàdòrò ya, ebe ndị ọrụ omebe iwu steeti ahụ nabàtàrà ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.