Obianọ Ekpebiela Ịnapụtasị Ala Gọọmenti Ndị Mmadụ Kpaara n'Isuanaocha

Jun 10, 2020 - 16:43
Jan 24, 2021 - 16:44
 0
Obianọ Ekpebiela Ịnapụtasị Ala Gọọmenti Ndị Mmadụ Kpaara n'Isuanaocha

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekpebiela ma kwuwaa na ọchịchị steeti ahụ wàtàrà ọgọdọ ịnapụtasị na inwetàghàchi ala gọọmenti Anambra ndị mmadụ kpààrà na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a n'Awka oge ọ na-anabàta mpụtara nnyocha na nchọpụta nke òtù ọrụ nnyocha ahụ gọọmenti guzobere maka ileba anya n'ihe banyere mkpara a kpaara ụfọdụ ala gọọmenti steeti ahụ n'Isuanaocha dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Awka North.

O kwuru na ọchịchị ya ga-emezùpụta ihe niile dị n'akwụkwọ mpụtàra nnyocha ahụ ndị òtù ọrụ ahụ wètàra, nke gụnyere ịkpara ala niile ahụ a na-ekwu maka ya n'ozuzu oke, ka ndị ọzọ wee si na nke ahụ mụrụ akọ. 

O kèlèrè ndị òtù ọrụ ahụ maka ezi ọrụ ha, ma kwe nkwà na ọ ga-akpọkwa ha ọzọ maka ụdị ọrụ dị etu ahụ, n'ihi na ọchịchị ya dị njikere inwetàghachi ala gọọmenti niile ndị mmadụ kpààrà na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Na mbụ n'okwu ya oge ọ na-enyefe mpụtàra na nchọpụta nnyocha ahụ n'aka gọọmenti, onyeisi oche òtù ọrụ ahụ a maara dịka 'Isuanaocha Community School Land Encroachment Panel' ma bụrụkwa eze ọdịnala obodo Nteje, bụ Igwe Rowland Odegbo kwùru na ha garùru n'ala ahụ na ụlọakwụkwọ ahụ a na-ekwu maka ya, ma nwekwa nzukọ, ha na onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, n'ime oge ha na-eme nnyocha ahụ. O mekwara ka a mara na ha na onwe ha nwèrè nzukọ ọtụtụ ugboro tupu ha kwekọrịta ma mee mkpebi ha 

Mkpebi nnyocha ahụ na-akọwa na gọọmenti ga-akpara ala ahụ, na-elebakwara ya anya nke ukwu, tinyekwuoro na a ga-enyochagharị ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ala ụlọakwụkwọ gọọmenti niile dị na steeti ahụ, tinyere ọtụtụ mkpebi ndị ọzọ òtù ọrụ ahụ mèrè.

Ọ dị ncheta na Gọvanọ Obianọ nọrọ n'abalị ise nke ọnwa Maachị ahọ wee guzobe òtù ọrụ ahụ pụrụ iche, ma bụkwa nke ụfọdụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu so na ya, nke gụnyere ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu; onyeisi ndị ọrụ nyegara Gọvanọ Obianọ, bụ Maazị Primus Odili; Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'ogo ntà, bụ Ọkammụta Kate Omenugha, tinyere Kọmishọna na-ahụ maka ala, bụ Maazị Bonaventure Enemali.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.