Obianọ enyela Igwe Amawbia na Igwe Umuerum asambodo n'Awka

May 29, 2020 - 06:35
Jan 22, 2021 - 20:39
 0
Obianọ enyela Igwe Amawbia na Igwe Umuerum asambodo n'Awka

Izunna Okafor, Awka

Ọ na-adị mma a kpụọ Diji, a kpụnye ya óké ji n'aka, maka na a nyụchaa nsị a kapịàghị ya ọnụ, ọ bụrụ òtòrò. Ka ọ dị taa, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ enyela ndị eze ọdịnala ọhụụ abụọ asambodo iji malite ọrụ n'ozuzu òkè dịka ndị ndu obodo ha dị iche iche.

Ndị eze ọdịnala ọhụụ abụọ ahụ e nyere asambodo bụ eze ọdịnala Amawbịa dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Awka South, bụ Igwe Chinyelu Nwora Molokwu, na ògbò ya nke obodo Umuerum dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ayamelum, bụ Igwe Christopher Ndibe.

Memme inye àsàmbodo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ebe obibi gọvanọ dị n'Amawbịa, ma bụrụkwa nke dọtara ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù, nke gụnyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị eze ọdịnala, ndị omebe iwu, ndị enyi, ikwu na ibè na ụfọdụ ndị òbòdò abụọ ahụ.

N'okwu ya na mmemme ahụ oge ọ na-enye ndị eze ọdịnala ahụ asambodo ha, Gọvanọ Obianọ kọwara ndị eze ọdịnala dịka ndị bara oke úrù na ndị nwere nnukwu ọrụ nà ntụnye pụrụ iche n'ịkwàlite udo ọganihu na mmepe obodo. O kwuru na ọ bụ mmasị ọchịchị ya ịkwàlite ezi mmepe tọrọ àtọ n'ime-ime obodo niile e nwere na steeti ahụ, kpọpụtasịa ụfọdụ ụzọ dị iche iche o sigòrò mee nke ahụ, nke gụnyere inye obodo ọbụla nde naịra iri abụọ ka ha wee họrọ ma rụọ ihe dị ha mkpà, nakwa ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ.

Aka na-achị achị bụ Obianọ kpọkùkwazịrị ndị eze ọdịnala ahụ ka sonyesie ike n'ịkwàdo na imezùputa amụmà na atụmatụ ọrụ mmepe dị iche iche ọchịchị ya ji n'aka. Ọ dụrụ ha ka ha gbaa mbọ hụ na a na-etinye n'ọrụ ma na-emezupụtakwa ntụziaka gọọmenti n'obodo ha dị iche iche, ọkachasị n'oge ugbua ọrịa nje korona na-ebì ụwa aka ọjọọ.

Gọvanọ Obianọ dụkwàrà ha ọdụ ka ha gbaa mbọ hụ na e nwee ezi mmekọrịta n'etiti ha na ndị ji ọkwa ọchịchị obodo ha, na ndị ha na-achị.

N'okwu nkè ya, Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ihe gbasaara echichi ọdịnala na ọchịchị ime-ime obodo bụ maazị Greg Obi tòrò ọchịchị steeti Anambra maka inye eze ọdịnala abụọ ahụ asambodo, bụ nke ọ kọwara na o meela ka echichi ha na ọnọdụ ha dịka ndị eze ọdịnala obodo ha zuo òkè. O kwukwara na nke ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụtara ìhè n'ịkwàlite udo na ọnọdụ mmepe bụ ịgbà n'obodo abụọ ahụ karịa ka ọ dị na mbụ.

N'okwu ha n'otu n'otu, eze ọdịnala abụọ ahụ, bụ ndị ọñụ jupùtara n'obì kelere gọọmenti steeti Anambra maka inye ha asambodo ahụ, bụ nke gosiri na ha abụrụla ndị steeti ahụ mà dịka ndị eze ọdịnala obodo ha dị iche iche. Ha kwekwazịrị nkwa na site n'enyemaka Chineke, na ha ga-eji oche eze ha wee rụọ ọrụ nke ọma, kwàlite udo na ọnọdụ mmepe n'obodo ha dị iche iche na steeti ahụ n'izugbe.

Ndị dị iche iche sonyere na ya bụ oke mmemme gụnyere okwupụta okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor; onyeisi ndị ọrụ nyegara Gọvanọ Willie Obianọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị; ode akwụkwọ ukwu nye Gọvanọ, bụ Maazị Willie Nwokoye; onyeisi ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Maazị Harry Udu; eze ọdịnala Ọnịtsha, bụ Igwe Nnaemeka Alfred Achebe, bụ onye duru ndị eze ọdịnala ndị ọzọ wee bịa, tinyere ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.