Obiano Enyela Igwe Ọhụrụ Orsumoghu, Ideani na Ugbene  Asambodo

Mar 2, 2021 - 06:31
 0
Obiano Enyela Igwe Ọhụrụ Orsumoghu, Ideani na Ugbene  Asambodo
Obiano Enyela Igwe Ọhụrụ Orsumoghu, Ideani na Ugbene  Asambodo
Obiano Enyela Igwe Ọhụrụ Orsumoghu, Ideani na Ugbene  Asambodo
Obiano Enyela Igwe Ọhụrụ Orsumoghu, Ideani na Ugbene  Asambodo


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ a nyụọ nsị, a kapịàghị ya ọnụ, ọ bụrụ òtòrò, maka na ọ na-adị mma, a kpụchaa Diji, a kpụnye ya óké ji n'aka.

N'ịgbaso nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie nọrọ na nsonso a wee nye ndị eze ọdịnala ọhụrụ obodo Orsumoghu, Ideani na Ugbene asambodo, iji gosi na gọọmenti kwàdoro ma nye ha ikike ịbụ eze ọdịnala obodo ha dị iche iche.

Mmemme inye asambodo a bụ nke weere ọnọdụ n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbia, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu n'ime steeti ahụ sonyere na ya.

Ya bụ mmemme bụ nke a nọrọ na ya wee nye Igwe Steven Onyekwelu Ezeji asambodo dịka eze ọdịnala obodo Ideani dị n'okpuruọchịchị ime obodo 'Idemili North'; nye Igwe Samson Chimakwa asambodo dịka eze ọdịnala obodo Ugbene dị n'okpuruọchịchị ime obodo 'Awka South'; ma nye Igwe Elochukwu Mbanefo asambodo dịka eze ọdịnala obodo Orsumoghu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ihiala.

N'okwu ya oge ọ na-enyefe ha asambodo ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwàrà omenala Igbo, ọdịnala Igbo, na ọdịbendị dịka ihe dị ezi mkpa na nke bakwara urù nke ukwuu, ma kwupụta mkpa ọ dị na ụmụafọ Igbo na-asọpụrụ ma na-echekwaba ihe ndị ahụ nke ọma, malite na ndị eze ọdịnala obodo ọbụla wee ruo na ndị ha na-achị achị. 

Ọ kọwakwara ndị eze ọdịnala dịka ndị bara oke úrù na ndị nwere nnukwu ọrụ nà ntụnye pụrụ iche n'ichekwaba omenala na ọdịnala, na n'ịkwàlite udo ọganihu na mmepe obodo. 

O kwuru na ọ bụ mmasị ọchịchị ya ịkwàlite ezi mmepe tọrọ àtọ n'ime-ime obodo niile e nwere na steeti ahụ, ma kpọpụtasịa ụfọdụ ụzọ dị iche iche o sigòrò mee nke ahụ. Ọ kpọkùkwazịrị ndị eze ọdịnala ahụ ka sonyesie ike n'ịkwàdo na imezùputa amụmà na atụmatụ ọrụ mmepe dị iche iche ọchịchị ya ji n'aka na steeti ahụ, ọkachasị n'ime obodo ha dị iche iche. 

Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha gbaa mbọ kwàlite udo tọrọ àtọ na ịdịnotu n'obodo ha dị iche iche, ma hụkwa na e nwere ezi mmekọrịta n'etiti ha na ndị ji ọkwa ọchịchị obodo ha, na ndị ha na-achị achị.

N'okwu nke ya, Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ihe gbasaara echichi ọdịnala na ọchịchị ime-ime obodo bụ Maazị Greg Obi kọwàra na asambodo ahụ e nyere ndị ahụ dabàrà adabà n'usoro iwu na-achị steeti ahụ.

O kelere Gọvanọ Obianọ maka inye eze ọdịnala atọ ahụ asambodo, bụ nke ọ kọwara na o meela ka echichi ha na ọnọdụ ha dịka ndị eze ọdịnala obodo ha zuo òkè. O kwukwara na nke ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụtara ìhè n'ịkwàlite udo na ọnọdụ mmepe bụ ịgbà n'ime obodo atọ ahụ.


Na ntụnye nke ya, onyeisioche òtù jikọtara ndị eze ọdịnala na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, ma bụrụkwa eze ọdịnala obodo Ọnịtsha, bụ Igwe Nnaemeka Alfred Achebe gwàrà ndị eze ọdịnala ọhụrụ ahụ ka ha were eziokwu, égwù nke Chineke na ịkwụba aka ọtọ wee duo obodo ha.

Na nzaghachi ha n'otu n'otu, eze ọdịnala atọ ahụ, kèlère gọọmenti steeti Anambra maka inye ha asambodo ahụ, bụ nke gosiri na ha abụrụla ndị steeti ahụ mà dịka ndị eze ọdịnala obodo ha dị iche iche. Ha kwekwazịrị nkwa na site n'enyemaka Chineke, na ha ga-eji ocheeze ha wee rụọ ọrụ nke ọma, kwàlite udo na ọnọdụ mmepe n'obodo ha dị iche iche na steeti ahụ n'izugbe.

Ụfọdụ ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyere Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adinuba; osote Ọkaokwu ụlọomeiwu steeti Anambra, bụ Dọkịta Paschal Agbọdike; Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ, bụ Ọkammụta Kate Omenugha; onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala, bụ Ọkaiwu Vera Okechukwu, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu, nakwa ndị sitere obodo atọ ahụ e nyere Igwe ha asambodo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484