Obianọ, Ezigbo Enyi Ụmụakwụkwọ — Omenugha

Aug 8, 2021 - 21:09
 0
Obianọ, Ezigbo Enyi Ụmụakwụkwọ — Omenugha


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ ka onye si eme ka ekwe si akpọ ya, maka na aha onye na omume ya na-agakọ.

Ka ọ dị taa, a kọwaala aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ dịka enyi ụmụakwụkwọ Anambra, onye ndu ha na nnukwu nna ha.

Ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti Anambra, bụ Ọkammụta Kate Azụka Omenụgha kwupụtara nke a n'isi ụlọọrụ ya dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, oge ndị nta akụkọ na-agba ya ajụjụọnụ banyere ncheta ụbọchị ọmụmụ Gọvanọ Obianọ.

O mere ka a mara na oge Gọvanọ Obianọ batara n'ọkwa ọchịchị n'ahọ 2014, na o kwere nkwà na o nweghị nwata ọbụla na steeti Anambra a ga-agbahapụ maọbụ leghara anya n'ihe gbasaara agụmakwụkwọ, n'ihi na nwata Anambra ọbụla kwesiri ịgụ akwụkwọ. O kwuru na Gọvanọ kwekwàrà nkwà na agụmakwụkwọ ga-erute mpaghara ebe niile na steeti ahụ, ọkachasị n'ime ime obodo; ma kwekwa nkwà ịkwàlitè ọnọdụ mmụta na agụmakwụkwọ steeti ahụ n'ogoogo dị elu na n'ogoogo mba ụwa.

Ọ sịkwa na Gọvanọ Obianọ agaala n'ihu na-emezupụta okwu ahụ o kwuru na nkwà niile o kwere ụmụakwụkwọ Anambra na ndị nkuzi steeti ahụ, n'ihi na o meela ka agụmakwụkwọ steeti ahụ bụrụzie nke e ji ama atụ n'ogoogo mba ụwa, ọkachasị n'ilekwàsà anya n'etu ụmụakwụkwọ steeti ahụ na ndị nkuzi si eme ihe na-ada ụda ma na-enwetakwa nturugo n'asọmpi dị iche iche, ma n'ogoogo ala Nigeria ma n'ogoogo mba ụwa.

O kwuru na Obianọ na-agbàkwa ndị nkuzi ume nke ukwuu, ma nwekwa ego mmachiàkpà na ụgwọ pụrụ iche ọ na-akwụ ụfọdụ ndị nkuzi nọ n'ime ime obodo, na ndị na-akụzi ihe ọmụmụ sayensi na ụfọdụ ihe ọmụmụ ndị ọzọ dị añaa, tinyere ụfọdụ ụzọ dị iche iche o si agba ha ume, ma na-akwụkwa ha ụgwọ ọnwa n'ogè.

Kọmishọna Omenụgha kwukwara na Gọvanọ Obianọ nyèkwara ntụziaka na o nweghị nwata akwụkwọ ọbụla bụ onye ọlụsị ga na-akwụ kọbọ maka agụmakwụkwọ na steeti ahụ, nyekwa ndị na-agụ akwụkwọ maka nkanụzụ ohere agụmakwụkwọ n'efu, malite na NTC-1 wee ruo na NTC-3, tinyekwa ọtụtụ ndị ọzọ o nyegoro ohere agụmakwụkwọ n'efu na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Ọ sị, "Ihe ndị a niile na ọtụtụ ihe ndị ọzọ Gọvanọ Obianọ na-eme na ngalaba mmụta bụ ezigbo ihe akaebe na-egosi na Gọvanọ Obianọ hụrụ agụmakwụkwọ n'anya ma bụrụkwa enyi ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi. Chetekwa na nna ya bụ onye nkuzi. Nke ahụ sokwa n'ihe nyeere ya aka iji ghọta na akwkụkwọ bara uru nke ukwuu ma dịkwa oke mkpà."

N'ekpere ya n'isi Gọvanọ Obianọ ná ncheta ụbọchị ọmụmụ ya, Kọmishọna Omenụgha jiri aha ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi steeti ahụ wee tuo ya aha dị iche iche, nke gụnyere 'Golden Governor (Gọvanọ Ọlaedo), 'Senior Advocate of Teachers' (ọnụ na-ekwuchitere ndị nkụzi) 'Alert Governor', 'Grassroot Developer of Education', 'The Most Education Friendly Governor', tinyere aha ndị ọzọ o turu ya. Ọ  gọkwazịịrị ya ọfọ ogologo ndụ na ahụ ike, ma kpee na ọ ga-aga n'ihu na-adịrị ya mma. O kpekwara na Chineke ga-aga n'ihu iledo ya ezinụlọ ya anya ma na-emekwa ha mma, n'ihi etu o si eledo ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi steeti ahụ anya, ma na-emekwa ha mma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484