Ọchịchị Buharị Ajọgbuona Onwe Ya -- Sinetọ Owie

Sep 11, 2017 - 10:04
Jan 23, 2021 - 18:12
 0
Ọchịchị Buharị Ajọgbuona Onwe Ya  -- Sinetọ Owie

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Otu onye  nnọchi anya n'ụlọ ọgbakọ ukwu sineeti ala anyị ma bụrụkwa onye ji ọkwa 'Chief Whip'  n'oge mbụ  n'ụlọ ọgbakọ ukwu ahụ, bụ maazị Roland Owie ekwuona na ọchịchị onye isi ala anyị bụ Buharị jọgburunnọọ onwe ya n'ihi ihe dị iche iche a na-ahụta na ya.

Sinetụ Owie kwuru nke a banyere mkpọlite ahụ onye isi ala kpọlitesiri ụfọdụ ndị isi na ngalaba dị iche iche n'ụlọ ọrụ mmanụ bụ NNPC, ma sịkwa hooha na ịkpọ ganịganị ndị otu dịgasị iche iche n'ala anyị na ihe ndị ọzọ ha na-emegasị ka mma karịa ọchịchị ya bụ nwoke.

Ọ sị na ọ baghị uru ịta ọtụtụ otu ndị a na-akpọgasị oku maka ikewa ala Naịjirịa ụta n'ihi na ọtụtụ ihe dị iche iche Buharị na-eme na otu o si enyegasị ọrụ gosiri n'ala abụghị otu, maka na ikpe mara eziokwu, aka azụ dị ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.